Coronavirus: Ihe dị iche n'ọrịa a na azụzụ nkịtị

Onye na-akwa ụkwara

Ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ama onye nwere ọrịa coronavirus bụ ahụ ọkụ na ogologo ụkwara.

Mana ọ pụtaghị na onye ọbụla ahụ ya dị ọkụ nwere ọrịa ahụ.

Ọpụtaghịkwa na onye ọbụla na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere bu nje corona virus.

Ọ bụrụ na ị na-ama uzere ugboro ugboro, maọbụ na imi gi na-agụpụta, maọbụ na isi na-awa gị, o nwere ike ịbụ azụzụ nkịtị, mana ọbụghị coronavirus.

Ngwa lee ihe dị iche na nnukwu 'B' na ọkpa ehi.

Ahụ ọkụ

Image copyright Getty Images

Ahụọkụ coronavirus bụ mgbe ekpomọkụ ahụ mmadụ gafere digrii 37.8.

Mana ọbụghị mmadụ niile nwere tamomita e ji amata etu ekpomọkụ ahụ dị.

Ya mere, ọ bụrụ na obi gi na azụ gị ka dị ọkụ karịa akụkụ ahụ gị ndị ọzọ, mara na ị ga-aga nnyocha.

Ụkwara

Image copyright Getty Images

Ọ bụrụ na ị na-akwapụta ihe na-alọ alọ mgbe ị kwara ụkwara, mara na ọ bụghị coronavirus kpatara nke a.

Ọ bụrụkwa na ụkwara gị bụ ịkwaa taa ọ laa echi, ọbụghị coronavirus.

Ụkwara coronavirus bụ nke na-akwa mmadụ ogologo oge, na-enweghị ihe ọbụla onye ahụ na-akwapụta.

Bekee na-akpọ ụdị ụkwara 'Dry Cough'.

Ihe ị ga-eme

Image copyright Twitter/@NCDCgov
Nkenke aha onyonyo Ndị NCDC kwuru na ha nwere ndịọrụ ahụike a zụrụ nke ọma maka igbochi ọrịa dịka coronavirus

Ọ bụrụ na gị maọbụ onye ị ma nwere ụdị ụkwara a nakwa ụdị ahụọkụ a, lee ihe ị ga-eme.

  1. Zeere mmekọrịta gị na ndị mmadụ
  2. Malite ikpuchi ọnụ gị na imi gi
  3. Chọọ ụzọ kpọọ ndị ọrụ ahụ ike. Akara ngalaba na-ahụ maka coronavirus na Naịjirịa bụ: 080097000010 maọbụ 08099555577 (ozi 'SMS')
  4. I nwekwara ike izigara ụlọọrụ mgbochi ọrịa bụ NCDC ozi na info@ncdc.gov.ng
  5. Ebe ọzọ ị ga-enweta ha bụ na akara twitter: @NCDCgov
  6. Ndị gị na ha bi ga-agbakwa mbọ zeere mmekọrịta ha na ndị mmadụ ruo ubọchị 14.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee etu nje ọrịa si ebufe onwe ha site n'aka atịtị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a