Nigerian Foods: Lee etu ị ga-esi sie 'plantain' ọ hapụ ite dọrọ n'afọ

Unele na nri dị iche iche Image copyright Food Ace/Instagram

Gwam gwam gwam gwam nri igaghị ejinwu ojoko nke ndị bekee na-akpọ Plantain were sii.

Ojoko dị a ka nwa agbọghọ mara mma a na-atụkwasara eze oge mgbe gboo.

OjokO na-enye ụmụ ihe na-enyemaka Bekee kpọrọ "Iron", "Vitamins", nakwa "fiber" n'ahụ.

E nwereike isi, ihụn, ịghe, ịgwọ maọbụ sekọ ojoko esekọ.

Lee ụzọ ole na ole ga-abụ isie Plantain ọ bụrụ ericha amịchaa aka.

1: Nke m ga-ebuzo bupute bụ ojoko ahụrụ ahụ

OtherFood Ace/Instagram

Image copyright Food Ace/Instagram

Nke a bụ mgbado ume ụmụ mmadụ ji ejide onwe ha ma agụrụ na-anyụ ha anya.

A na-eji mmanụ nri na ụgba, ose na ogiri were esuru ya. Ụfọdụ na-ejikwa ofe tomanto eri ya.

Etu e si esi ya

  • Gote ojoko chatụrụ acha
  • Kpechasia azụ ya
  • Hunye ya n'ọkụ
  • Na-akpagha ya ka ọghara ire ọkụ
  • Oghee, ị kpachasia arụ ya
  • Meputa mmanu Igbo were ya rIpia ya.

2: Ojoko eghere eghe

Image copyright Food Ace/Instagram

Ndi akpịrị ibem bianu oo. Biko kedu nri bụ eze ma a sị ka e chi eze maka nri eji agba ụtụtụ.

I nwere ike iji akwa maọbụ akamu were rie ya.

E jikwa unele eghere eri ọsikapa.

E jikwa unele eghere eghe eri beans makana ha abụọ bụ dị na nwunye na-ekweghị agbasa agbasa.

E ji unele eghere eghe agwọ anụ, nke ndị bekee gizdodo.

E jikwa unele eghere eghe eme kpekere nke bekee na-akpọ "Plantain chips".

3: Ojoko e ji akwụkwọ nri gwọ

Image copyright Food Ace/Instagram

Nwanne ọ bụrụ na ọbara maọbụ ike kọrọ gị n'ahụ, ndị dọkịta na-adụkarị ọdụ ka i rie ojoko eji akwụkwọ nri were gwọ.

Ọ bụ ojoko na-achaghị acha ka e ji esi ya bụ nri.

Etu e si esi ya

  • Bacha ojoko na-achaghị acha
  • Bee ya kịrị kịrị ma sacha ya wunye n'ite.
  • Gbanye mmiri na-agaghị agafe ogo unele ahụ rinne.
  1. Bee yabasi tinye na ya.
  2. Sụọ krafish, ose na maggi tinye
  3. Tinye azụ ọkpọ maọbụ anụmanụ ọzọ na-amasị gị
  4. Ọ sụwa , ghewe were ngazi eji agwa gari wee tụgharịwa ya.
  5. Ọ lọkọọ etu isi chọọ, i fenye ya akwụkwọ nri.
  6. Fotuo ya ozigbo.

Nri eghela ooo.

4. Ojoko esiri esi

Image copyright Food Ace/Instagram

Onye ume na-adịghị ihụwa, ighe maọbụ igwọ , ga-esinwu ya etu ahụ ọ dị ma suo ya n'ofe ọbụla masiri ya.

5. Ojoko esere ka nri ji

Nke a ọ tụrụ gị n'anya? Ya a tụkwala gị ma ncha. A na-akwoọ ya ka flour ma sekọọ ya na akpụ were ya rie ofe gụrụ gị agụụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a