Coronavirus: Lee ndị njọ ahịa na-egbuzi kamgbe ọrịa a malitere

Enoch Adeboye Image copyright Adeboye/Facebook
Nkenke aha onyonyo Adeboye onyeisi ụka Redeem kara ụka n'okpokoro ụlọụka n'izuụka gara aga

Kamgbe ọrịa coronvirus malitere, akụnụba mba ụwa akụọla afọ n'ala.

Ọtụtụ ahịa anaghịkwa aga aga, mana ụfodụ bụkwa ugbua ka ha ji agbazi nke bụ aka ahịa.

Mba dị icheiche n'ụwa nakwa steeti dị iche iche na Naịjirịa amachiela ọgbakọ ndị mmadụ.

Nke a mere ka ụfọdụ na-ekwu na ndị ụkọchukwu na ndị amụma ga-ebuzi ọnụ.

Ma lee ihe ndị ọzọ na-ebe akwa kamgbe ọrịa coronavirus malitere:

Ndị ụka

Nkenke aha onyonyo Ụlọụka RCCG dị n'Ikoyi kwuru na ha emechiela

Dịka amachirila ọgbakọ ebe ndị mmadụ buru ibu, ya bụ ihe metụtakwara ndị ụka.

N'ụbọchị Sọnde gara aga, ọtụtụ ụlọụka na Legọs gbachiri agbachi.

Ọbụghị sọ na Legọs, ọtụtụ steeti na Naịjirịa amachiela ụka n'ihi na ndị mmadụ na-agbakọ ebe ahụ.

Nke a mere ndị mmadụ ji ekwu na ndị ụkọchukwu na ndị amụma ga-ahụ nke tọrọ fada.

Ha na ekwu na dịka ndị ụka anaghịzi abịa, ego onyinye na ego 'tithe' alaala.

Ụkọchukwu ọ ga-emezi aghaa?

'Betting'

Image copyright Getty Images

Tupu coronavirus amalite, ngwụcha izuụka niile na-ekpo ọkụ na Naịjirịa n'ihi ọtụtụ asọmpi egwuregwu bọọlụ.

Ọbụghị naanị ikiri bọọlụ na-eme ndị mmadụ obi ọma, nke ọzọ bụ itinye ego iji kaa ndị nwere ike imeri.

Ọ bụ nke a ka a na-akpọ 'betting na bekee.

Mana coronavirus emeela ka amachie egwuregwu niile.

Nke pụtara na ndị nwere ụlọahịa maka 'betting' nọzị na nnukwu njọ ahịa ugbu a.

Ebe nkiri bọọlụ (viewing centres)

Image copyright Getty Images

N'ihi na ọkụ latrik anaghị adịkarị, ọtụtụ na-ahapụ ụlọ ha gaa ebe ha ga-anọ ekiri bọọlụ.

Mana kamgbe a kwụsịrị asọmpi niile, onye ọbụla nọzị be ya.

Ndị nwere ụlọ ebe a na-ekriri bọọlụ wee bụrụzie Erọn gbara aka laa.

Ụlọ nkwụ/Ụlọ ite egwu

Image copyright Getty Images

Onwekwaghị onye na-achọ ịga ebe a na aṅụ nkwụ maọbụ agba egwu nke Bekee kpọrọ 'bars' na 'clubs'.

Ọrịa coronavirus achọghị mmekọrịta ahụ mmadụ na ibe ya ma ncha ma ncha.

Gịnịzi ka ndị nwere 'bar' na 'club' ga-emezi ugbua?

Ndị nhazi mmemme

Image copyright Instagram/eventsbyeki

Bekee na-akpọ ha 'event planners', mana njọ ahịa na-ajọgbu ha kịtaa.

Gọọmentị steeti dị icheiche amachiela ọgbakọ karịrị mmadụ iri ise, nke pụtara na a ga-akagbu maọbụ yighaa nnukwu mmemme ọbụla.

Onye 'event planner' ọ ga-ebuzi ọnụ?

Ndị ọkwọ ụgbọala

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego

Otu onye ọkwọ ụgbọala aha ya bụ Lincoln Idowu gwara BBC Igbo na njọ ahịa na-ajọgbu ha ugbua.

Idowu na-akwọ ụgbọala 'Uber' na Legọs.

O kwuru sị: "N'oge mbụ anyị na-aga ọdọụgbọelu gaa buga maọbụ bulata ndị njem ihe ruru ugboro atọ n'otu ụbọchị."

"Mmadụ nwere ike inweta ihe ruru puku naịra 30 n'otu ụbọchị, mana ugbua onweghi ihe anyị na-ahụzi."

Lekwa ndị na-ebuba ego nke ọma n'oge a

Ndị ahịa nri

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye ọbụla na-ego ihe nri na-edebe

Dịka a na-atụ egwu na gọọmentị nwere ike ịkpọchikọrọ elu na ala, ọtụtụ ndị mmadụ na-ego ihe nri n'ike n'ike.

Ka ọ ga-abụ opi ike gbuo, ka ha nwee nri ha na ezinụlọ ha ga na-eri ruo mgbe ikuku ọjọo a kuchara.

Ndị ahịa oroma nkịrịsị

Kepukepu na-ekwu na oroma nkịrịsị na mmanụ aṅụ a gwọkọrọ ọnụ na-enye aka maka ndị nwere ọrịa coronavirus.

Ọ bụ eziokwu na ndị ọkachamara ekwupụtabeghi nke a, ọtụtụ dnị mmadụ egojuola oroma nkịrịsị na be ha.

Ndị ụlọọrụ nzikọrịta ozi ekwentị

Image copyright Jude
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ nọzị n'ụlọ ha arụ ọrụ n'ihi egwu maka coronavirus

Ọtụtụ ndị mmadụ si n'ụlọ ha arụ ọrụ ugbua ọkacha na Legọs nakwa Abuja.

Nke a pụtara na ndị mmadụ ga na-emefu nnukwu ego iji gote akara ịntaneetị.

Ebee ka ego niile ahụ na-aba? Ihe ị machakwa.

Ndị 'super market'

Image copyright Luke Nwachukwu
Nkenke aha onyonyo Ụlọahịa 'super market' na-eju n'ọnụ n'oge a

Ndị nwere 'super market' na-agba nnọọ nnukwu aka ahịa n'oge a.

Ndị mmadụ na-ejupụta n'ọnụ na-azụrụ ihe dị mkpa iji cheere coronavirus aka mgba.

Akwụkwọ mposi nke bekee kpọrọ 'toilet tissue', mmiri nsacha aka pụrụ iche (hand sanitizer), nakwa akwa mkpuchi ihu (face mask) na-aga ahaịa nke ọma ugbua.

Ọtụtụ n'ime ha etinyela ego buru ibu, mana ndị mmadụ ka na-abụ ya ụbụ.

Ndị ahịa kọmputa

Ọtụtụ ndị na-achọghị ịpụ n'ụlọ ha bụ na ịntaneetị ka ha na-azụrụ ihe dị ha mkpa.

Ya mere na ndị dịka 'jumia' maọbụ 'konga' na-amụrị ugbua.

Dịka Igbo si atụ n'ilu, ala adịghị mma bụ uru ndị nze.

Ihe ọbụla mere n'ụwa nwere ndị ọ ga-adabara.