Imo state: Onye uweojii gburu di na nwunye gbuo onwe ya

onye uweojii Image copyright Getty Images

Otu onye uweojii n'Imo steeti egbuola di na nwunye gbukwaa onwe ya.

Kenneth Enamika sị na nwunye ya bụ nwoke bụ Oluchi Aputanze kwere ya nkwa alụmdi tupu ọ hapụ ya ga lụọ Cajethan Aputanze.

Enamike bụ onye hapụru edemede tupu o gbuo onwe ya dere na o nyere Oluchi otu narị naịra na iri na ise (N150,000) ka o kwechere ya nkwa na ọ ga-alụ ya, ya agbahapụ ya gaa lụọ onye ọzọ.

Olando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti kwuru na "mgbe Kenneth chọpụtara na Oluchi alụọla dị ọzo, ọ gara be ha ịgba ya ụgwọ ego ahụ o nyeburu ya".

Ebe ahụ ka di Oluchi bụ Cajethan Aputanze jiri yiwa ya egwu sị na ya ga-eji ọtụmọkpọ gbuo ya ma ọ hapụghị nwunye ya aka.

"Ya meziri enneth ji were egbe ya gbagbuo Oluchi na di ya, gbukwa onwe ya n'otu ahiri ahụ.

Ikeokwu sị na ozu mmadụ atọ a ndị n'ọba ozu ụgbụa dịka ana enyocha ka amatakwụọ ihe mere ha.

Jamb na ụmụakwụkwọ

Image copyright Jamb/Twitter

Ụlọọrụ ule akwụkwọ ịbanye mahadum dị n'aka bụ Joint Admission and Matriculation Board (Jamb) ekwuola na ụmụakwụkwọ Ọwụnwa Anyanwụ kacha gbaa mgbọ n'ụle ha lechere n'izu gara aga.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Fabian Benjamin gwara BBc Igbo na n'ime mmadụ otu narị na iri asatọ (180) ha jidere maka ịzụ ohi n'ụle, na Naịjrirịa niile, na ndị ejidere n'ala Igbo kacha.

Ndị si Imo, Anambara na Enugwu steeti kachasị gbaa gbọ na ule 'Jamb' nke afọ a .

Ndị na-eso ha n'aghụghọ n'ụlọ bụ ndị Abia, Adamawa, Jigawa, Kaduna, Kano, Kwara, Ondo, Oyo, nakwa Osun.

Mmadụ ọle ejidere gbara mgbọ n'ule Jamb

Abia - mmadụ 8

Anambra - mmadụ 12

Ebonyi - mmadụ 3

Enugwu - mmadụ 12

Imo - mmadụ 26

Gana na Coronavirus

Image copyright Getty Creative Stock

N'Afrịka, mba Gana etiela mkpụ maka otu ọrịa coronavirus sị agbasa be ha.

Naani taa bụ Tuzde, a chọpụtala mmadụ iri abụọ na anọ bu ya bụ ọrịa nke bunitere ọnụọgụgụ ndị bụ ya bụ ọrịa na iri ise na abụọ (52).

Indịa emechiela ezi na ụzọ

Image copyright AFP/Getty Images

N'ofesi, onyeisiala mba India bụ Narendra Modi agwala ndị be ya ha chefuo ịpụ ezi rụrọ abali iri na otu maka egwu coronavirus.

Nke a pụtara na ya bụ iwu ha tiri maka apụghị ezi eruola ebe niile na mba ahụ.

Ebugharịala 2020 Olympics

Image copyright Twitter

N'egwuregwu e, emechaala bufe oge a ga-N'Afrịka eme egwuregwu Tokyo Olympics site n'ọnwa Julaị afọ ruo afọ ọzọ.

Onyeisiala mba Japan bụ Shinzo Abe kwuru nke taa.

Cheta na ogbochi mgbasa coronavirus dị gị n'aka, kwọọ ya mgbe dum.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ga-agwọ coronavirus nwereike bụrụ nwa mpe mpe ihe - Mbaka

Isiokwu Ndị Emetụtara