Anambra Catholic Priest: Ihe ndị uweojii kwuru maka Fada a hụrụ ozu ya n'ime ụgbọala

Fada Charlse Odogwu Image copyright Fr. Ohai Mem. Model School Oroma/Facebook

Dịka akụkọ maka ọnwụ Fada Charlse Okeke-Odogwu na-ewu na Soshal Midịa, Kọmishọna ndị uweojii nke Anambra steeti nyere iwu ka emee nyocha maka ọnwụ onye ụkọchukwu a.

Fada Okeke-Odogwu bụ ụkọchukwu na-achịkọta Holy Cross Parish, Oroma-Etiti dị n' Anam, n'Anambara Steeti.

Mgbe ndị uweojii gara Oroma-Etiti ebe ọ mere, ha mere nyọcha ha ma chọpụta na ọ bụ ọnwụ chi ya na-enweghị ihe nrụrụaka dị na ya.

Ha gwa kwara ndị ezinulọ Okeke-Odogwu ka ha ga n'ụlọọrụ ndị uweojii gaa dee akwụkwọ maka ọnwụ ya.

Ndị mmadụ hụtara ozu Okeke-Odogwu n'ime ụgbọala ya n'ụbọchị Tuzde.

Akụkọ na-ekwu na Odogwu soro mee nzụkọ ndị 'Diocese' ya ma na ogosịghị ihe mgbaama na-ahụ adịghị ya.

Kama, kepukepu na-ekwukwa na ọgbọrọ agbọrọ tupu ọnwụọ n'ime ụgbọala ya.

Tupu ọ nwụọ, Okeke-Odogwu bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ 'Father Ohai Memorial Secondary school, Oroma-Etiti, Anam, Anambra steeti'.

Nwoke gbagburu nwa ya nwoke maka ebubo na o gburu nna ya

Akụkọ na-ekwu na nwoke aha ya bụ Cyril Ugwu gbagburu nwa ya nwoke aha ya bụ Kenneth Ugwu.

Akụkọ na-akọwa na Kenneth onye na-azụ ahịa ahụ ụgbọala na Legọs lọtara were sị nne ya ka ha gaa gbute akwụ n'ubi.

Ọ bụ mgbe Kenneth lọtara nanị ya were sị nna ya na ya ga-alaghachị Legọs ọsịsọ.

Nkea mere ka nna ya nyọwa ya enyo were gaa n'ime ọnụ ụlo Kenneth ebe ọ hụrụ isi nwunye ya nwa ya nwoke tinyere n'akpa.

Cyril Ugwu jiri egbe ya gbagbuo Kenneth ma gosi kwa ndị mmadụ isi nwunye ya mgbe ha gbatara.

Ndị obodo mechara gaa n'ọhịa ebe ha hụrụ ozu nwunye Cyril Ugwu.

Onye na-ahụ maka mmekọ ndị uweojii Enugwu steeti na ndị ọha bụ Daniel Ndukwe Ekea kwuru na ha nwetere mkpesa maka ya kama ha-enweghị ike ikwu ma ọ bụ eziokwu ụgbụa.

Isiokwu Ndị Emetụtara