Igbo culture: Ekwensu ọ bụ 'satan' n'ala Igbo?

  • Chigozie Ohaka
  • Broadcast Journalist, Igbo service
Akpụrakpụ ekwensu nku arụsị ekwensu n'Enugwu
Nkọwa foto,

Akpụrakpụ ekwensu nku arụsị ekwensu n'Enugwu

Mgbe ị na-ekpe ekpere ma sị "Chineke napụ ekwensu ike", Kedu ekwensu nke ị na-akpọ.

Ọ bụ nke edere n'akwụkwọ nsọ ka ọ bụ nke ndi nnanna anyi ha na-efe?

Eziokwu bụ na ha abụghị otu.

Soro anyi na njem a ka anyị mata ihe omenala Igbo kpọrọ ekwensu na ihe ndị ofufe Kraịst kpọrọ ekwensu.

Ụkọchukwu na ọkammụta n'African Traditional Religion' bụ Chika Okpalike na ọkammụta n'asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe bụ ndị tinyere ọnụ n'okwu a.

Na mbido

Ka anyị bido n'akwụkwọ nsọ mgbe onyeozi Pọlụ gara obodo Athens ọ hụru arụsi ndị obodo ahụ kpọrọ "Chi a na-amaghị" were jiri ya kọwara ha onye Chukwu bụ.

Chika Okpalike ji ya kọwaa na mgbe ndị ofufe Kraist batara ala Igbo.

Ha lere anya were chopụta na ndị igbo nwere Chi ha na-efe ha kpọrọ ekwensu.

Dịka ọ dị n'akwụkwọ nsọ, onye iro ndị nke Kraist bụ "Satan" nke mere ka ndị wetara ofufe kraist were sị na Satan bụ ekwensu.

Mazi Chigozie Nnabuihe kọwakwara na n'akwụkwọ nsọ, na Jehova bụ aha ndị Juu n'akpọ Chukwu oge agha ma o bụ oge ihe ike mere.

Nnabuihe n'akọwa na njirimara "Jehova" yikwara njirimara chi ndị Igbo n'akpọ ekwensu.

Ọ kọwakwara na Satan bụ ajọ mụọ ebe ekwensu sọ n'otu chi ndị igbo na-efe oge gboo, ọkachasị oge agha.

Kedu onye ndị Igbo na-akpọ ekwensu?

Nkọwa foto,

Nwoke a na-akpọ onwe ya Eze Ekwensu

Okpalike gwara BBC Igbo na mgbe ochie, onye mmadu mejọrọ chọrọ ịbọgwara ihe e mere ya na-ejekwuru ekwensu ka ọ lụọrọ ya ọgụ.

Maọbụ ị chọkwaa imesi mmadụ ike na-eleghị anya n'azụ, onye ahụ ga-ejekwuru ekensu n'ihi na ekwensu anaghị eme ebere ma ọ chọrọ imesi mmadụ ike.

Ọ kọwakwara na e nwere ndị na-efe ya bụ ekwensu nke mere na a ka nwere ụfọdụ ebe n'ala Igbo n'aza ya bụ aha.

Aha onyonyo,

Etu m siri bụrụ Eze Ekwensu

Okpalike kwuru na e nwere ebe a na-akpọ Ụmụekwensu na Delta steeti ma nwekwaa ndị a na-akpọkwa Ụmụekwensu n'obodo Ngwa dị n'Abịa steeti, enwekwara ugwu ekwensu n'obodo Ụkpọ nke dị n'Anambra steeti, ma nwee kwa ọhịa ekwensu n'obodo Ụga.

Ọ kọwara na nke a apụtaghị na ndị a bụ ajọ mmadụ maọbụ ndị a bụrụ ọnụ ma kama na ọ bụ ndị dopuru onwe ha iche ikpere ekwensu kamgbe ochie.

Kedu ihe mere ndị ofufe Kraist ji kpọọ ekwensu satan?

Nkọwa foto,

Nwaada Jane Ada bụ onye ọkpụ ihe, ọ na-akpụkarị arụsị ndị Igbo fere mgbe gboo

Ụkọchukwu Chika Okpalike kọwara na ndi Igbo enweghị chi ha na-efe dịka ajọ mmụọ maọbụ 'Satan'.

Ọkpalike kọwara na ndị ofufe Kraist amaghị etu ha ga-esi kọwaara ndị Igbo mgbe ochie maka Satan n'ihi na echiche dị otu adịghi na ala Igbo.

Kama mgbe ha hụtara na ekwensu bụ chi ndị Igbo na-efe dịka chi na-ebuso agha ma na-akpa ike na emeghi ebere, mgbe ahụ ka ha jizi si na satan na ekwensu bụ otu.

O kwukwara na mgbe ọbụla ndị n'agbasa ozi chọrọ igbasa ozi ha n'ebe ohụrụ, ha na-eji chi ndị ahụ na-efe were kọwara ha maka ozioma nke Kraịst.

Aha onyonyo,

Jane Ada: Nwaada Igbo ji ịkpụ ụzụ na-egosi ụwa arụsị e jiri mara ndị Igbo

Enwere etu ndị Igbo si efe ekwensu mgbe ochie?

Okpalike kọwara na mgbe ochie, enwere ndị na-efe ma dibia na-elekọta arụsị ahụ bụ ekwensu.

O kwukwara na enwere ụzọ aja abụọ nke bụ "Aja nchụnye" na "Aja nchụpụ".

Ọ kọwara na dịka etu ekwensu si eme, na aja a na-achụrụ ekwensu bụ aja nchụpụ nke pụtara na enweghị onye na-eri aja ekwensu.

Ihe ị kwesiri ịmata

Ihe ikwesiri ịmata n'edemede a dịka ndị ọkammuta sị kowara anyị bụ

1)Ekwensu n'ọmenala Igbo abụghị ajọ mmụọ kama ọ bụ chi ndị Igbo na-efe

2)Ndị ofufe Kraist ji ya akọwara ndị mgbe ochie ka ha nwee ike ịghọta na e nwere satan

3)Ekwensu bụ chi ndị mgbe gboo na-akpọ oge agha, oge mmadụ chọrọ ịbọgwara ihe e mere ya maọbụ mgbe mmadụ chọrọ imesi mmadụ ọzọ ike

4)Ekwensu nwere dibia na ndị na-efe ya mgbe ochie.

5)Etu ikenga, agwu, ibini ukpabi na chi ndị ọzọ dị ka ekwensu dịkwa n'ọmenala Igbo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: