Abba Kyari: Onye ọ ga-anọchị anya ya?

Babagana, Adamu, ElRufai, Hameed
Nkọwa foto,

N'ime mmadụ anọ a onye

Ndị ọkacha mara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị sị n'ebe uche ndị mmadụ dịzi ugbua bụ onye ga-anọchi anya Abba Kyari, bụ onyeisi ndị ọrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari.

Kyari so n'otu ndị ọnụ kachasị eru n'okwu n'ọchịchị Onyeisiala Buhari ya mere ọtụtụ na-eche na onye ọbụla ga-anọchi ya ga-eritekwa ụdị ikike o nwere.

Otu onye ọkacha mara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị si Mahadum Abụja bụ Abubakar Karị sị na Buhari nwere ọtụtụ ndị enyi o che nwereike ịnọchi Kyari.

"Eche m na Buhari nwereike ịhọrọ otu n'ime Babagana Kingibe, onyeisi ndị 'Custom' bụ Hameed Ali maọbụ mịnịsta agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu dịka onyeisi ọrụ ọhụrụ ya," Kari kwuru.

"Ọ gaghị abụ ihe itụnanya ma Buhari họrọ otu n'ime ndị a."

Kari sị na ọ ga-ara ahụ ị sị na gọvanọ Kaduna Steetị bu Nasir el-Rufai ga-abụ onye e nwereike ịhọrọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ si na-eche.

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Nkọwa foto,

Onyeisiala Buhari and Abba Kyari bụ enyi karịa afọ iri anọ

Ọ sị na ọkwa onyeisi ọrụ nke Onyeisiala dị ezigbo mkpa mana ị gaghị eji ya tụnyere ọkwa gọvanọ.

"Ụfọdụ na-eche na Onyeisiala Buhari ga-ahọrọ onye bụbu mịnịsta ihe na-eme n'obodo bụ AbdurRahman Dambazau mana echeghi m na ọ ga-eme ya maka na Buhari ahọrọghị ya n'ọchịchị ya nke abụọ."

Mgbe anyị kpọtụụrụ onye na-ahụ maka ọdịmma pati APC na Naịjirịa bụ Ibrahim Masari, ọ sị na ọ ka-abụ ụtụtụ ikwu okwu banyere nke a.

"Ebe ọ bụ na ọkwa a abụghị nke a na-emere ntuliaka, ọ ga-adị mma ka a hapụ Onyeisiala Buhari ka o ruchaa uju ọnwụ Kyari tupu o kwupụta onye ga-ewere ọkwa ahụ." Masari kwuru.

Babagana Kingibe

Ebe foto si, Twitter/Nigeria Government

Nkọwa foto,

Onyeisiala Muhammadu Buhari na Babagana Kingiggbe

Kamgbe Buhari weere ọchịchị nke ugboro abụọ n'afọ 2019, Kingibe abụrụla ezi enyi nye ọchịchị a nke ka nke bụ maka na ọ bụ onye Borno Steeti dịka Abba Kyari.

Na-agbanyeghi na onye bụbu Onyeisiala bụ Umaru Yar'Adua chụpụrụ ya n'ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị etiti, nke a nwereike imegide ohere o nwere.

Tinyekwara ọgbaghaara dapụtara mgbe a kagburu ntuliaka nyere MKO Abiola mmeri n'afọ 1993, Kingibe bụ osote Abiola mana ọchịagha Sani Abacha mechara mee ya mịnịsta ihe na-eme n'obodo.

N'ihi ihe ndị a, ụfọdụ ndị si mpaghaara ọdịda anyanwụ nwereike ha agaghị a nabatacha ya.

Mana Kingibe maara ihe egwu na-akụ n'ihe banyere ọrụ ọha na eze.

Hameed Ali

Ebe foto si, @CustomsNG

Nkọwa foto,

Onyeisi ndị ụlọọrụ customs

Ọ bụ onyeisi ndị ọrụ 'Custom' na Naịjirịa. Ali na Onyeisiala Buhari malitere ịrụkọ ọrụ kamgbe ụbọchị ha n'ọrụ ndịagha.

Ọtụtụ na-ahụta ya dịka otu n'ime ndị Buhari tụkwasịrị obi.

Ndị enyi Ali na-agba ama etu o si bụrụ onye na-akwụwa aka ya ọtọ, nakwa onye na-eme ihe n'usoro.

Ọ bụrụ na e mechaa họrọ ya, nke a nwereike ọ gaghị adị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị makana onweghi onye ọ na-ele anya n'ihu.

Adamu Adamu

Ebe foto si, Adamu Adamu Twitter

Ọ bụ ya jị ọkwa mịnịsta agụmaakwụkwọ kamgbe afọ ise Buhari weere ọchịchị n'afọ 2015.

Ya na Buhari arụkọọla ọrụ ọtụtụ afọ ma bụrụkwa otu n'ime ndị nwereike ịgakwunwu onyeisi ya n'otu ihu n'ime ọbi ọchịchị Onyeisiala.

Tupu e nye ya ọkwa mịnịsta, Adamu bụ onye odeakwụkwọ. Ọ na-ekwupụtakarị uche ya n'ihe na-eme n'obodo nakwa na mba ndị ọzọ.

Ọ bụrụ na Adamu mechaa nọchie anya Abba Kyarị ọ ga-abụ ihe ime ụlọ ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ga-asị na enweghi oke mgbanwe.

Gọvanọ Nasir el-Rufai

Ebe foto si, Kaduna Govt

Nkọwa foto,

Malam Nasir El-Rufai gọvanọ Kaduna steeti

Gọvanọ Nasir el-Rufai nke Kaduna Steeti bu coronavirus ugbua - Ya bụ otu ọrịa ahụ gburu Abba Kyarị.

Akụkọ kwuru na gọvanọ a nyere aka azụ iji nwete ọkwa a n'afọ gara aga, mana e nweghi ihe akaebe gosiri nke a.

Kamgbe Buhari hiwere otu CPC ka el-Rufai malitere ịbụ ezi enyi ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye nwere ọnụ na gọọmentị Naịjirịa.

Ọ bụrụ na a họrọ ya dịka ụfọdụ ndị na-ekwu, ọ ga-abụ ohere nye ya n'ịkwalite ebumnobi ya ịbụ onyeisiala na 2023 ma ọ bụrụ Buharị chizuo ọchịchị ya.

Ndị ọzọ a na-atụanya nwerike ịnọchi Kyari bụ:

  • Buba Marwa; bụbu onye agha na Naịjirịa bụkwa onye chịbụrụ Legọs na Naịjirịa.
  • Hamid Ali
  • Boss Mustapha
  • Shehu Darazo