N1.59trn FG Loan: Gọọmenti ga-ebitezi ya n’ụlọ

  • Chris Sanctus Okereke
  • Broadcast Journalist
Ụlọmgbazite ego mbaụwa

Ebe foto si, Reuters

Gọọmenti etiti Naịjirịa ebugharịala ọnọdụ na ya bụ ego mgbazite ha chọrọ ibitebụ ndị mbaụwa maka iji mezuo ego ha chọrọ itinye n'ọrụ n'afo 2020.

Gọọmenti Naịjirịa tinyeburu ego dị ijeri narị naịra asatọ na iri ise (N850 trn) dịka ego ha ga-agbazite ndị mba ofesi ebe ha ga-agbazite ijeri narị Naira asaa na iri itoolu na anọ n'ụlọ maka imezu ego ha chọrọ iji rụọ ọrụ n'afọ 2020 a.

Na mkpụrụ ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2019 ka ndị ọmeiwu Naịjirịa tinyere aka n'akwụkwọ maka ego dị ijeri Naịra iri na ụma (N10.59trn) bụ nke ha chọrọ itinye n'ọrụ n'afọ 2020.

Ego a ji ihe dịka pasenti 1.52 gbaa mpe; atụgharịa ya na ego ọbụrụ otu ijeri naịra na ụma iri ise na abụọ (N1.52 trn) bụ nke ha chọrọ ibite na mba ofesi iji mezuo ọgụ.

Ụlọọrụ Debt Management Office (DMO) sị na ụgbụa, na o nweghịzị nke ha ga-agbazite n'ofesi.

N'okwu ha n'ụbọchị Wenezde, DMO sị na, "echiche a bụ maka ka ihe siri dowe ihu n'ụwa ugbua maka agha Covid 19 a bụ ozuru mba ọnụ".

Gịnị dị iche n'ịgbazite ego n'ụlọ na ịgbazite ya n'ofesi?

Onye ọkachamara n'okwu akụnaụba bụ Uche Uwaleke gwara anyị na ihe dị iche dị.

Uwaleke sị na ihe mere o ji dị mma ibite ya bụ ego n'ụlọ bụ maka dọla iri elu karịa ka ọ dị ugbua.

Ọ kọwara na ọ bụrụ na dọla rịa, na ọ ga afụ ụfụ n'ahụ ịkwụ ya bụ ụgwọ maka na ego ọmụrụnwa ya ga-arịkwa.

Mana agbanyeghị, dịka okwuru, ibite ego na mba ofesi na-aka ọnụ ala karịa ibite ya n'ụlọ maka na ego ọmụrụ nwa nke mba ofesi na-aka ọnụ ala.

Ọ sịkwa na ihe dịka ụlọọrụ 'International Monetary Funds (IMF) na-enye ihe dị ka afọ atọ tupu amalite ekwu ụgwọ e bitere ha ma kwụchaa ya n'afo ise ebitere ya bụ ego.

Ọ sịkwa n' uru ọzọ dịkwa n'ibete ego na mba ofesi bụ na 'ọ ga-enyere gọọmenti aka ịkwalite dọla aga eji azụ ahịa nke ga-eme na ụkọ dọla agaghị adị, ọkachasị ugbua ahịa mmanụ agbidi danyụrụ anya.

Mmanụ agbidi na-ada dọla iri abụọ. Nke a pụtara na ọ bere ihe na dọla iri atọ e ji mee bọjeti.

Kedu ka ọ ga-esi emetuta ndị mmadụ?

Uwaleke sị na ọ ga-emetuta ndị mmadụ n'ụzọ adịghị mma ma ọ bụrụ na gọọmenti etinyeghị ya bụ ego mbite n'ụzọ ọ ga-amịtara obodo ezi mkpụrụ dịka iji ya rụọ ụzọ, ọkụ, ụlọọgwụ na ndị ọzọ.

Ọ si na gọọmenti tinye ego ndị a iji emezie ụmụ ihe ndị a eji enyere ndụ aka, na ụfụ ya bụ ego agaghị adị nke ukwu.

Cheta na ego a na-ere mmanụ agbidi, bụ ihe Naịjirịa jiri hiwe isi malitere ịnyụ ka ọkụ kemgbe coronavirus bịara ụwa mgba nke bụ na ego e ji azụ ya bụ mmanụ erụghịzị isiego e ji arụpụta ya.

Anyị lebakwara anya n'ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ya bụ ahịa mmanụ agbidi nyụọ ka ọkụ kpam kpam.

Olee otu ọnụahịa mmanụ agbidi mbaụwa ga-esi metụta Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ahụbeghị mere n'ahịa mmanụ agbịdị n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Epreelu dịka udu mmanụ agbịdị nke mba Amerịka rere tọrọ.

Ya bụ na n'Epreelu 20, 2020, ego mmanụ agbịdị dara ruo tọrọ -$00:35.

Nke a pụtara na ihe mba Amerịka kwadoro ịre mmanụ agbidi ha kpọrọ West Texas Intermediate (WTI) n'ọnwa Mee ji ihe karịrị pasenti narị atọ (305%) sepụ ego n'ihe a na-ere ya.

Ndị ọkachamara n'ahịa mmanụ agbidi sị na ihe na-eme n'ahịa ha emenụbeghị n'ụwa.

Cheta Nwanze, onyeisi na SBM Intelligence, bụ ụlọọrụ na-eme nnyocha dị icheiche, kwuru na "Ọ bụ ahụghị ebe a ga-anwụnye mmanụ amịpụtara butere ọdịda nke a."

Ọnụọgụgụ ndị ụlọ ọrụ Dow Jones sị na ụdị ihe ahụ emetubeghị kemgbe amalitere idetụ usoro azụmahịa mmanụ agbidi kemgbe 1983.

Agbanyeghị na ndị otu OPEC + buturu mmanụ ha na-ebuputa na mbaụwa, ihe na-ebe ka na-ebe.

Ndị International Energy Administration na-eche na mmanụ agbidi ha ga-ere n'ọnwa Epreelu ga-eji ihe karịrị udu mmanụ ruru nde iri abụọ na itoolu daruo ala maka agha Covid-19.

Ya bụ agha mere na ndị mmadụ anaghị agagharị nke mere na azụmahịa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya kpụrụ afọ n'ala n'ụwa gbaa gburugburu ugbua.

Ya mere ahịa mmanụ na ihe niile si na ya ji daa pịị.

Ya bụ ọnwụ na-egbu nwankita abụghị taa ka ọ malitere.

Kedụ ebe ọdịda oge mmanụ a malitere?

O bidororii tupu Saụdị Arabịa na Rọshịa amalite agha mmanụa gbidi ha nụrụ n'ọnwa Maachi nke mere ha jiri jụ iso OPEC butuo mmanụ ha na-eresị mbaụwa.

Ebe foto si, Getty Images

Nke a mere ka mmanụ agbidi gbọọ kasaa n'ahịa, mere ndị mba bụ ọkaibe n'ahịa mmanụ agbidi ji kwekọrịta ịwetulata aka na mmanụ ha na-ebupu na mbaụwa.

Mana nke a akwụsịghị ihe ọbụla. Ihe na-ebe ka na-ebe.

Kedụ ebe o si metụta Naịjirịa?

Onye ọkachamara na-azụmahịa na ịchụnta ego bụ Christain Ezeagu kwuru na-egwu ga-adị ma Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi.

"Anyị ga-enwe nsogbu ma Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi maka na ọ bụ ebe ahụ ka anyị si enweta ego niile anyị nwere".

Ọ sị na Naịjirịa enweghị ụzọ ọzọ ha si akpata ego, ya mere ya bụ ajụjụ ji buru ajọ echiche nye Naịjirịa ugbua.

Ọ sịkwa, "Ndị na-azụ ahịa nkịtị agaghị ahụ ndị ga-ego ha ihe. Ohi na mpụ dị iche iche ga-amụbanwanye n'ododo".

Ebe foto si, @BashirAhmad

Nkọwa foto,

Ọ bụ ego mmanụ agbịdị bụ na Naịjirịa na-emegharịnwu ahụ

Patrick O. Okigbo nke atọ bụkwa onye aka ya dị na mmanụ agbịdị sị na oge Naịjirịa na-akpanwu ego ha ji ahazi bọọjetị ha ọnaghị arụpụtanwu ihe mmepe obodo.

"Ugbua ọ gaghị enwetenwu ego ọ ga-eji bulie bọọjetị ya, ị na-eche na o nwereike ịrụpụtanwu ihe mmepe obodo?" Maazị Okigbo jụrụ.

Ezeagu n'onwe ya gara n'ihu sị n'ọnwa abụọ gara aga, Naịjirịa na-eretezu Dọla dị ijeri narị naịra mgbe ha na ere otụ udu mmanụagbidi dọla iri ise maọbụ karịa.

Mana ugbua, ego otu udu adarụọla anya rụọ dọla iri abụo na ise ebe ha jị dọla iri atọ mee bọjet ha.

Ọ sị na e nwere olile anya na ihe ga-adị mma, mana ọ dịrị otua gawa, mara na-egwu ga-adị n'obodo.

Odogwu ọzọ n'arukwa n'uloọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na-achọghị ka akpọọ aha ya si; "ọbụrụ na Naịjirịa ereghị mmanụ agbidi, Naịjirịa na ọtụtụ ụlọọrụ agaghị akwụlị ego ha bitere nke ga-ebute ịchụ ọtụtụ mmadụ n'ọrụ."

Ebe foto si, AFP

Maazị Nwanze tụrụ anya na amakaọjọ, atụru anya na ọnụahịa nwere ike ịgbagolite ruo dọla iri abụọ na abụọ n'onwa Juun.

Ọ sị na ihe kpara ọdịda n'uche ya bụ na ndi mmadụ ji egwu azụ ya bụ ahịa.

"Ka a na-amalite iche maka WTI n'ụbọchị Tuzde, ego a ga-alịkwa," bu okwu Nwanze bịara na mezu n'ụtụtụ Tuzde dịka erere ya bụ mmanụ $13.

Maka Naịjirịa, Nwanze si na ihe mere nwanza jiri ebe n'ọhịa ka nọkwa ebe ọ nọ.

"Usoro anyị si akpata ego anwụọla. Nke a pụtara na anyị kwesiri ihazigharị etu anyị ga-esi na-akpata ego maka emeghị nke a ga-ebute ezigbote nsogbu tupu afọ ise agacha."

Okwu a bụ nke ndị ọkachamara ndị ọzọ gbadoro ụkwụ na ya makana na anụ nwere otu mpụ na-anwụkarị ọsọsọ.