Igbo Tradition: Uru egwu ọnwa bara na ọzụzụ na njikọ ndị Igbo

  • Chukwunaeme Obiejesi
  • Broadcast Journalist, Igbo
Ọnwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị Igbo na-atụ ilu sị na 'ịpụ egwu ọnwa bụ ure maka na onweghị onye ọnwa anaghị apụta na be ya

Tupu agụmakwụkwọ abata n'ala Igbo, e nwere ụzọ dị icheiche e ji akụzirị ụmụaka ihe.

Otu n'ime ha bụ nke kacha pụta ihe bụ egwu ọnwa.

Na-agbanyeghi na a na-akpọ ya egwu ọnwa, ọ pụtaghị na ọ bụ sọsọ egwuregwu ka a na-egwu.

Uru egwu ọnwa bara n'ala Igbo n'oge gboo buru ibu.

Oge e ji eme egwu ọnwa

Aha onyonyo,

Igbo Tradition: Uru egwu ọnwa bara n'ala Igbo n'oge gboo

Iji mee nchọpụta maka akụkọ a, BBC Igbo kpọtụụrụ Obinna Okoro onye e ji 'Achara Man' mara, bụkwa onye ihe gbasara omenala Igbo doro anya nke ọma.

Ọ kọwara na ọ bụ oge ọkọchị ka e ji agba egwu ọnwa.

Nke a bụ maka na anaghị atụ egwu na mmiri nwere ike izo chụbaa ndị mmadụ n'ime ụlo.

Ọzọkwa bụ na ọ bụ oge arụcharala ọrụ ubi nke ndị Igbo na-ahụta dịka oge ezumike.

Okoro kwuru sị: "N'oge ahụ, ọbụghị naanị ụmụaka na-aga n'ọgbọ ebe a na-agbakọ maka egwu ọnwa."

"Onye ọbụla ma okenye ma nwata na-aga, onweghikwanụ onye na-atụ egwu na ndị ohi nwere ike ịba na be ya zukọọ ihe o nwere."

E tu e si akụzi ihe n'oge egwu ọnwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọ bụ na-ama egwuregwu obodo ka a na-agbakọ agba egwu ọnwa

Nke mbụ, dịka Mazị Okoro si kọwaa bụ site n'akụkọ ifo.

"Ndị okenye na-akọrọ ụmụaka akụkọ iduu na ọba. Akụkọ ndị abụghị ihe mere eme kama ha bụ akụkọ e ji akọwa na ihe ọjọọ jọrọ njọ."

Nke ọzọkwa bụ iji aha ndị mere arụ n'obodo agụ egwu iji kwaa ha emu ka ndị ọzọ wee mụta ihe.

Okoro kwuru sị: "Onye zuo oshi a ga-eji aha ya mepụta egwu ka ihere ya mee ya nakwa ka ụmụaka mụta na oshi adịghị mma."

"Mmadu dịnaa nwanne ya, a ga-ejikwa ha mee ihe akaja ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ"

"O nwee onye mụrụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ, a na-eji aha nwa ahụ gụọ egwu ọṅụ wee kuziere ụmụaka uru nwa bara n'obodo."

Uru ndị ọzọ egwu ọnwa na-abara ndị gboo bụ:

  • Ọ bụ ihe e ji egosi nwanne na nwanne
  • Ọ bụ ihe na-egosi ịdị n'otu na udo
  • Ọ bụ ihe e ji akpa obi ọma
  • Ọ na-enyekwa aka ka ụmụaka ahụ adịghị gbakee ngwa ngwa, n'ihi na nwata nọrọ n'ụlọ na-anụ ebe ụmụaka ibe ya na-agba egwu ọnwa, ọ ga-amali soro ha pụọ, nke a ga-enye aka ka ọ gbakee ọsọ ọsọ

Ndị agaghị apụta egwu ọnwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọbụghị onye ọbụla na-aga n'ọgbọ ebe a na egwuri egwu ọnwa

BBC Igbo kpọtụkwaara nwaada Celestina Obiejesi, onye kọwara na ọbụghị mmadụ niile na-eso apụ egwu ọnwa.

  • Onye bu ohu anaghị eso aga egwu ọnwa
  • Onye bu osu anaghịkwa eso ndị aga egwu ọnwa, n'ihi na a na-ahụta ha dịka ndị e wepuru ewepu
  • Onye mere ihe ala na-asọ nsọ dịka onye dịnara nwunye mmadụ, onye e jidere n'ohi, maọbụ onye ṅụrụ iyi asị agaghị eso agbakọ n'egwu ọnwa ruo mgbe a chụrụ aja iji kpụọ arụ
  • Onye na-arịa ọrịa na-efe efe anaghị eru ndị mmadụ nso n'ihi na a ga-edopu ya iche

Gịnị chụlara egwu ọnwa?

Maazị Okoro kọwara na ụka so na otu ihe chụrụ ọtụtụ omenala ọsọ n'ala Igbo, nke gunyere egwu ọnwa.

Mana Okoro kọwara na ụka na omenala bụ otu.

Iji maa atụ, "akwụkwọ nsọ kwuru 'a bụ m ụzọ, eziokwu na ndụ', mana nnanna anyị ha agwala anyị kamgbe gboo na 'eziokwu bụ ndụ'"

Ọzọkwa bụ agụmakwụkwọ nke ndị bekee bụ nke a kpọrọ 'formal education'.

"Ihe ndị a so na ihe melara egwu ọnwa anyị, mana anyị agaghị ahapụ ịkọwara ụmụ anyị ka ha mata etu anyị si mụọ ihe n'oge gboo" Okoro kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: