Coronavirus Tips: 'Disinfectant' anaghị agwọ coronavirus

Coronavirus Tips: 'Disinfectant' anaghị agwọ coronavirus

Dịka onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tọzde, o kwuru na ọ ga-amasị ya ma e mee nnyocha ịmata ma e nwere etu a ga-esinwu jiri disinfectant na-agwọ ọrịa coronavirus.

Mana nke a mere ka ọtụtụ malite ikwu na Trump kwuru na 'disinfectant' nwere ike ịgwọ ya bụ ọrịa.

Nke a bụkwa asị o.

Aṅụkwala ihe ị na-amaghị isi na ọdụ ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo