Lee ihe anọ ị na-ekwesịghị ịgwa nwatakịrị na-erubeghi afọ 18
- Chimamaka Ihenacho
- Broadcast Journalist, Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Ụwa atụgharịala ugbua nke mere na nwatakịrị na-erubeghi afọ 18 abụrụbeghi okoroobia maọbụ agbọghọbịa.
Mgbe gboo, e nwere ndị na-erughi afọ 18 tupu a lụnye ha nwunye maọbụ di, mana ihe ndị ahụ abụrụla ezigbo arụ n'ụwa ugbua.
N'otu aka ahụ, e nwere ụdịrị ihe ndị ị ga-agwanwu nwa ka na-eto eto mgbe ahụ ọ ghara ịbụ njọ maọbụ arụrụala, ọ bụghị na ihe ndị ahụ adịghị njọ ma ị nọrọ ala chee ya eche oge ahụ.
Mana etu ụwa dị ugbua, ị kwesịghidị itinye ya n'uche gị ma ya fọdụzịa ikwupute ya n'ọnụ gị.
Kama ịgwa nwatakịrị ihe ndị ga-emerụ ya ahụ maọbụ tinye ya na nsogbu dịka ọnwụnwa, ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịlekọta ụmụaka na-enye ntuziaka ka
ị mara ihe ndị ga-enyere ha aka.
BBC Igbo kpọkuru Dennis Onoise na Ngozi Okoro bụ ndị ọkachamara n'ihe gbasara ụmụaka, ndị kwuru sị na ọ kacha bụrụ ọrụ dịrị nne na nna ịkọwara ụmụaka ihe ndị a.
Ihe ndị ị na-ekwesịghị ịgwa nwa na-etorubeghi afọ 18
1) Agwala nwatakịrị "Ị kpụọla ara o" maọbụ "lekwa etu ike gị ha":
Ha kọwara na ọ na-abụkarị onye nọ nso na-emebikarị ụmụaka, nke bụ na mgbe okenye malitere ịgwa nwatakịrị ụdịrị okwu a, e nwereike o tinyewela anya ọjọọ n'ahụ nwa ahụ.
Ha kwuru na ọ ka mma nne na nna ikuziri nwatakịrị maka ahụ ya tupu ọ mụta ya n'ezi.
Dịka ndị ọkachamara a si kwuo, ọtụtụ oge, ịmụta ya n'ezi bụ ihe na-achịpụta ụmụaka ụkwụ n'ama, ma mee ka ụmụaka 'mebie'.
Ha kwukwara sị kpọọ ya aha ọ bụ dịka "ọtụ", "amụ" ka ha mara, kama ịkpọ ya ihe yiri ya n'ihi na ị chọghị ịkpọ okwu aha.
2) Akpọla nwatakịrị "di m" maọbụ "nwunye m":
Ha kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ okenye ịkpọ nwa na-etobeghi eto ihe ndị a, n'ihi na ọ na-agbagwoju ụfọdụ ụmụaka anya.
Ụfọdụ okenye na-eji ohere ahụ arafu ụmụaka, sị ha "bịa ka anyị mee ihe di na nwunye na-eme".
Ọzọ bụkwa na iwu Naịjiria megidere nwatakịrị na-erubeghi afọ 18 ịlụ di maọbụ nwunye, nke bụ na okenye e jidere ka ọ na-akpọ nwatakịrị aha a adaala iwu nwereike itinye ya na nsogbu.
3) Agwala nwatakịrị "ọ dị ka ị chụwala nwaanyị" maọbụ "ọ dị ka i sowela nwoke":
Ịgwa nwa na-etobeghi eto ụdịrị okwu a nwereike itinye ya na nsogbu dịka ịmụta ihe gbasara akwamiko na-etobeghi eto.
Ụfọdụ na-eji ohere ahụ egosi ụmụaka ihe nkiri ndị gba ọtọ, ọkachasị ma ha ghọgbuchaa ha ebe ha ga-asị ha na na-egosi ha ndị "dị ka ha".
4) Akpọla nwatakịrị aha ọjọọ:
Aha ọjọọ ndị dịka "itibọrịbọ", "isi akị", "onye umengwụ", "efulefu", "akwụna" "onye oshi" wdgz, bụ aha ndị nwereike inye nwatakịrị nsogbu.
Ị na-ajụ etu ọ bụ? Ha kwuru na nwatakịrị a na-akpọkarị aha a nwereike imalite ikwenye n'ime ya, nke ga-eme ka ọ kpawa ụdịrị agwa ahụ a na-asị na o nwere.
Ha kwuru na nke a ga-eme ka nwa ahụ chefuzie maka ịgba mbọ, ọ ga na-asị ma ọ bakwaranu uru ebe ọ bụ na ọ gbara mbọ ma ọ gbaghị aha ọjọọ a kpọrọ ya ka ọ na-aza.
Ha kwukwara na n'ihi na e nwere ụmụaka uche ha akachabeghi aka, ụfọdụ nwereike gbuo onwe ha n'ihi okwu ọjọọ a gwara ha.
Ihe ọzọ ndị ọkachamara kwekọrịtara na ya bụ na ọ ka mma nne na nna kụziri ụmụ ha ihe ndị a nwereike itinye ha na nsogbu n'aka okenye na-awakpo ụmụaka, tupu ha amụta ya n'ezi.
N'ihi na a mụta ya n'ezi ọ na-abụkarị nke ọjọọ na-ebute nsogbu.