Nwoke nwunye ya nwụrụ sị na ọ bụ 'nleghara anya' UNTH kpatara ya

Nwoke nwunye ya nwụrụ sị na ọ bụ 'nleghara anya' UNTH kpatara ya

Dịka Ụwa niile na-gbaghrị maka nje Corona Virus, ọtụ nwoke bụ Nwachukwu Alagbu ji anya mmiri na-ekwuputa na ụlọ ọgwụ UNTH Enugwu jị nleghara anya gbuo nwunye ya bụ Nkiru Alagbu.

Njinji ahụ jiri ụbọchị march 15, 2020 oge nkiru lara mmụọ.

Mazi Nwachukwu Alagbu kọọrọ BBC na Nkiru nwunye ya bụ onye na-arịabụ ọrịa obi nakwa obara mgbali elu kamgbe ọtụtụ afọ ma na aṅụkwa ọgwụ ya.

Okwuru na ọrịa nwunye ya kazịrị njọ ụbọchị march 15 nke mere ha jiri buru ya gaa ụlọ ọgwụ di iche iche tupu ha rute na UNTH Enugwu bụ ndị ọkacha mara maka ọrịa obi.

Alagbu kwara arịrị na ndị Dọkịnta na nọọsụ nọ na Emergency ekweghị emetụ nwunye ya aka n'ihi na ha sịrị na ihe na eme ya yiri Corona Virus.

O kwuru na ya yọrọ ha elu yọọ ha ala, gosikwa ha akwụkwọ Lab ya niile mana ha ekweghị emetụ ya aka.

N'agbanyeghị na dọkịnta ha zigara ha UNTH ọ kwara ka ha nyere nwunye ya na ekuzi ume ọkụ aka mana ha hapụrụ ya n'ụgbọala ejiri bute ya.

Ka ọgachara awa atọ Nkiru Alagbu nọrọ n'ụgbọala ahụ kubee.

Mazi Alagbu kwuru na ngwa ngwa nwunye ya nwụrụ ka onye isi ụlọ ọgwụ UNTH bụ CMD Obinna Onodugo gbadatara were juwa ihe mwere ha ejighi metu nwunye ya aka.

Alagbu kwuru na CMD ahụ nọ n'ihu ha kwuo na ha kwesiri iyinye uwe mgbochi Bekee kpọrọ "PPE" e nyere ha maọbụrụ na ha chere na ọ bụ Covid 19.

Oge BBC jụrụ ndị UNTH ajụjụ maka ya, ha ekweghị etinye ọnụ n'okwu ahụ.

Mazi nwachukwu Alagbu kwuru na ọ bụ eziokwu na nwunye ya anwụọla mana ya chọrọ ka ụlọ ọgwụ UNTH na ndị dọkinta niile nọ ọrụ na "Emergency" ụbọchị ahụ zaa ajụjụ ihe ha jiri hapụ nwunye ya ọnwụọ ka ọkụkọ ebe a na-adọba ụgbọala.

Ọ sị na chọrọ ka ha zakwaa ajụjụ ihe ha jiri si na nwunye ya bụ coronavirus ebe ya gosiri ha akwụkwọ na ọbụ ọrịa obi bụ nke Bekee kpọrọ "bp" na eme ya.