Abacha Loot: Ihe mere ego Abacha bupuru ji bụrụ agwụ agwụ

  • Chukwunaeme Obiejesi
  • Broadcast Journalist, Igbo
Ọchịagha Sanị Abacha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọchịagha Sanị Abacha chịrị Naịjirịa malite n'afọ 2003 ruo 2008

O meela afọ 22 aka chịburu Naịjirịa bụ Ọchịagha Sani Abacha ji nwụọ.

Mana ruo taa, mba dị icheiche na-ezitere Naịjirịa nde kwuru nde ego bụ nke a na-ekwu na Abacha zupuru oge ọ bụ onyeisiala.

Malite mgbe Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala, ruo oge nke Umar Yar'Adua, ruo n'aka Goodluck Jonathan wee ruo n'oge ugbua, ego Abacha ka na-abatara Naịjirịa.

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu, n'ụzọ ịkpa ọchị, na ọ bụ Abacha bụ otu onye larala mmụọ ma si n'ala mmụọ na-enyere Naịjirịa aka.

Gịnị mere ego Abacha a anaghị agwụ agwụ?

Ebe foto si, Twitter/Trader Moni

Nkọwa foto,

Atụmatụ 'Trader Moni' bụkwa otu ihe gọọmentị kwuru e ji ego Abacha mee

Ha dị ụzọ ihe atọ mere o ji dị ka ego Abacha zupụrụ na Naịjirịa anaghị agwụ agwụ.

Chidi Lemchi bụ onye ọkachamara n'okwu banyere akụnụba nke bekee kpọrọ 'economist'.

Ihe atọ ndị gụnyere:

1) Ego ka nkụ: Lemchi kwuru na ego Abacha zupụrụ na Naịjirịa bụ atụrụ taba.

Ọbụghị n'otu ụlọakụ nke ọ na-abụ n'otu mba ka o zoro ego ndị ahụ.

Ọ jụrụ sị, "a chọpụta nke o zoro n'ụlọakụ Sizaland, kedu maka nke dị na Briten?

"Ị chọta nke Briten, ị chọtala ndị o zoro n'Amerịka?"

Dịka ngalaba mba ụwa na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ 'Transparency International' si depụta n'oge gara aga, a na-ele anya na ego Abacha zupuru na Naịjirịa bụ ihe dịka otu ijeri dọla ruo ijeri dọla ise ($1b - $5b)

2) Usoro e si eweghachi ego a adịghị mfe: Dịka Igbo si atụ n'ilu, ikunye enwe mmiri dị mfe mana ịnata ya iko adịghị mfe.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ego ndị ahụ bụ n'ụlọakụ dị na mba ofesi ka ọ dị

Usoro a ga-agafe tupu mba ọbụla ekweta inyeghachi naịjirịa ụfọdụ ego ndị ahụ abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba.

Ọzọkwa bụ na o nwere ụfọdụ ihe ndị ọchịchị mba ndị ahụ na-atụ anya n'aka ndị ọchịchị Naịjirịa tupu ha ekwe inye ha ya bụ ego.

Ihe ndị a gụnyere: Etu e si asọpụrụ ikike dịịrị onye bụ nke Bekee kpọrọ 'human rights', ihe a ga-eji ego ndị ahụ mee, dịrị gawazie.

Ebe foto si, second-river-niger-bridge.com

Nkọwa foto,

Akwa mmiri Naịja nke abụọ so na ihe gọọmentị kwuru a ga-eji ego Abacha nke a wee rụọ

3) Nrụrụaka: Lemchi kọwakwara na nrụrụaka bụ ihe ọzọ na-egbochi ego niile e kwuru na Abacha zupuru ịlọghachi Naịjirịa.

O kwuru sị: "Ndị ụlọakụ mba ụwa chọrọ ka ndị ọchịchị Naịjirịa gwa ha hoo haa ihe a ga-eji ego ndị ahụ mee."

"Ha agaghị achọ ka eweghachi ego ahụ ọ banye n'akpa ụfọdụ ndị ọchịchị."

"Kama ha chọrọ ka e were ya rụpụta ihe doro anya dịka ụzọ, ụlọakwụkwọ maọbụ ụlọọgwụ."

Mana Lemchi kwuru na ego ikpeazụ Naịjirịa nwetara bụ nke a sị na Abacha zupuru, bụ ya ka ọchịchị onyeisiala Muhammad Buhari ji eme "trader moni".

Cheta na "trader moni" bụ atụmatụ gọọmentị ji agbazinye ndị ahịa obere ego maka ịzụ ahịa ha.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ atụmatụ a ma kwuo na Onyeisiala na ndị pati ya ji ụzọ dị ọtụ zụọ vootu ndị mmadụ na ntuliaka nke 2019.

Mana ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami kwuru na ego nke a ga-aga n'ọrụ a na-ahụ anya dịka akwa mmiri Naịja nke abụọ, okporoụzọ si Legọs gaa Ibadan, dgz.

Ego ole a natarala Abacha ruo taa

  • Mee 2002: Onyeisiala Obasanjo na ezinụlọ Abacha nwere nkwekọrịta nke mere Naịjirịa ji nata ha otu ijeri dọla na ụma abụọ
  • Nọvemba 2003: Ngozi Okonjo-Iweala kwuru na obodo Jersey Island nyeghachiri Naịjirịa nde dọla 149
  • Sepụtemba 2005: Okonjo-Iweala kwukwara ba mba Sizaland nyeghachiri Naịjirịa nde dọla 458 nakwa akụnụba ndị ọzọ ruru ijeri dọla abụọ ($2bn)
  • 2007: Mịnịsta ego bụ Nenadi Usman kwuru na ego niile a natarala n'aka Abacha, nke ruru ijeri dọla abụọ na ụma ise ($2.5bn) bụ nke ha nyere ngalaba gọọmentị dị icheiche iji rụọ ọrụ.
  • June 2014: Mba Liechtenstein weghachiri nde dọla 227 bụ nke ha sị na Abacha zuru n'ohi.
  • August 2014: Ngalaba ikpe nkwụmọtọ nke mba Amerịka bụ 'Department of Justice' kwuru na ha ga-enyeghachi Naịjirịa nde dọla 480.
  • 2016: Mba Swizaland kwuru na ego ha nyeghachirila Naịjirịa bụ nde dọla 723 bụ nke ha boro ebubo na Abacha na ezinụlọ ya zuru
  • Janụwarị 2018: Mba Swizaland nyeghachiri Naịjirịa nde dọla 322 site n'ego ha kwuru na Abacha zupuru
  • May 2020: Obodo Jersey Island nyeghachiri Naịjirịa nde dọla 311 site n'ego ha kwuru na Abacha zuru

N'ọnwa Maachị afọ a, otu a kpọrọ SERAP degaara gọọmentị etiti akwụkwọ ka ha kọwaara ndị ọha obodo etu ha si mee ego ruru ijeri dọla ise bụ nke a na-ebo ebubo na Abacha zuru.

Ndị SERAP kwukwara na e nwere nnyocha gosiri na ego Naịjirịa nwetechachiri n'aka Abacha bụ nde dọla 635, nde paund 75, nde dọchmak 30, ijeri naịra itoolu, ọtụtụ ụgbọala na akụnụba dị icheiche n'Abuja, Legos na Kano, na ihe ndị ọzọ.

Mana Abubakar Malami zaghachiri na gọọmentị ejighi n'aka ego ole Abacha zupuru kpọmkwem.