Coronavirus Outbreak: 'Etu m si chọpụta onye mbụ bu Covid19 na Naịjirịa' - Dr Allison Amarachukwu Karen
Coronavirus Outbreak: 'Etu m si chọpụta onye mbụ bu Covid19 na Naịjirịa' - Dr Allison Amarachukwu Karen
Dọkịta Allison Amarachukwu Karen bụ onye chọpụtara nwoke mbụ si mba Ịtali bubata ọrịa coronavirus na Naịjirịa, kọwara etu o si chọpụta na ihe na-arịa nwoke ahụ bụ coronavirus.
Ọ sị na site na ọzụzụ o nwere, mgbe nwoke ahụ gwara ya na oyi na-ama ya, isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ na ọ matara na o nwereike ịbụ coronavirus.
Na nke a mere o ji kpọtụrụ onyeisi ya kpọtụkwara ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrị na Naịjirịa bụ NCDC.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ụjọ bara ya ahụ maka mmekọ ya na nwoke ahụ mana o wezugara onwe ya iche maa mee ihe ndị o kwesịrị ka ọ hara ibute ọrịa a.
Amarachukwu sị na kamgbe ahụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekele ya n'ebe ọ dị ukwuu maka mbọ ọ gbara ịchọpụta nwoke a.
Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo na Chiemela Peter.