Coronavirus in Nigeria: Gịnị mere na adịghị egosi anyị ime 'isolation centre'?

Naịjirịa ahaziela ebe a na-edobe ndị bu ọrịa iji chebiri maka ndị bu ọrịa coronavirus

Ọrịa coronavirus adịla ka otito na-adịghị ala ala n'ahụ ụmụ ụwa.

N'izuụka a niile, ihe ụmụ Naịjirịa kpụ n'ọnụ bụ ka e gosi ha ime ụlọ ndopu ebe a na-edowe ndị na-arịa ọrịa coronavirus.

Ụfọdụ na-ajụ ajụjụ a kwuru na ha ekwenyeghi na e nwere ihe dị ka ọrịa a, nke ha ji ekwe na ọ batala na Naịjirịa, n'agbanyeghị na ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) na-ewepụta ọnụọgụgụ ndị butere ya ọhụrụ kwa ụbọchị.

Ụfọdụ ndị a gara n'ihu sị ka e gosi ha ihe onyonyo ndị bu ọrịa a ebe ha nọ n'ime ebe a na-elekọta ha bụ "isolation center" na Bekee, maọbụ ka e depụta aha ha.

N'ihi ekweghi ekwe a, BBC Igbo gbara mbọ jụọ ndị mmadụ na soshal midia ma ha a ga-achọ ka ebiputa aha ha ma ọ bụrụ na ha bu ọrịa a.

BBC Igbo gara n'ihu jụọ ndị kọmịshọna ahụike steeti dị iche iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ihe mere ha ji ghara ị na-egosi ndị mmadụ ime "isolation centre" ndị a, lee ihe ha kwuru:

Dọkịta Vincent Okpala bụ kọmịshọna ahụike nke Anambrasteeti kwuru na ọ bụ ihe dị mma igosi ndị na-arụ ụka maka coronavirus.

O kwuru nke a na mkparịtaụka onye kwuo uche ya nke BBC Igbo kpọrọ ya.

O kwuru na tupu e mee nke a, a ga-enwe nkwekọrịta na mbinyeaka n'akwụkwọ si n'aka ndị na-arịa ọrịa, ma emeghị nke a, ndị ahụ nwere ike ịgba gọọmenti akwụkwọ.

O kwuru na ihe ọzọ ya bụ atụmatụ nwere ike ibute bụ akaja nye ndị na-arịa coronavirus.

Okpala kwuru na onye ọbụla na-achọsi ike ịhụ ime ụlọ ebe ndopu nwere ike ịkpọ ụlọọrụ NCDC ka ha kpọbaa ya ebe ahụ maọbụ kọwaara ya ihe niile ọ chọrọ ịma.

Ebonyi steeti

Kọmịshọna ahụike nke steeti ahụ kwuru na ha na-egosi "isolation center nke ha" kama na agaghị egosi ihu ndị mmadụ maka ihe so ya.

Ọ gwara anyị na ndị ntaakụkọ na-abata n'ime ụlọ ndopu dị n'Ebonyi steeti ahụ, wee na-ese ndị mmadụ onyonyo.

Aba steeti

Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n'Abịa steeti a bụ Jonathan Osuji kwuru hohaa na ha agaghị emeli nke a n'ihi na ndị ọbụla na-arịa ahụ kwesịrị ka a ghara ịgba ha n'anwụ.

O kwuru na o cheghị na ya bụ atụmatụ dị mma.

N'okwu ya, "onye ọbụla chọrọ ịmata etu na ndị nọ n'ụlọ ndopu nọ nwekwara ike ịkpọ ụlọọrụ NCDC n'ekwentị ma gwa ha na ha chọrọ ịhụ n'anya, mana ha hụchaa ha, ha chere mee nyocha ka ha mara ma ha

ebutela ọrịa coronavirus.

Imo steeti

Anyị gbalịrị ka anyị nụta n'ọnụ kọmịshọna ahụike nke Imo steeti mana ọ bubeghị ekwentị ya.

Mana lee mkparịtaụka anyị na ya nwere n'oge gara aga gbasara ọrịa coronavirus.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: