Ese Oruru: A tụọla onye kpachiri ya mkpọrọ afọ iri abụọ na isii

Yinusa Dahiru

Ebe foto si, Ovieteme George

Ị chetere nwatakiri ahụ a kpachiri na Bayelsa steeti, kpọrọ ya ga maye ya ịgawa okpukperechi Alakụba bụ ebe a lụrụ ya?

Ụlọikpe ukwu na Yenegoa, Bayelsa steeti amaala Yinusa Dahiru ikpe afọ iri abụọ na isii (26) maka ịkpachi Ese Oruru afọ na 2015.

Ese gbara afọ iri na anọ mgbe Yinusa kpachiri ya n'Ọgụst 2015.

Jọstis Jane Inyang mara ya bụ nwaamadị Alakụba ikpe arụ anọ n'ime ise e kpere ya ikpe.

A mara ya ikpe afọ ise n'arụ nke abụọ, maa ya ikpe afọ asaa n'arụ nke atọ, maa ya ikpe afọ asaa ọzọ n'arụ nke anọ makwa ya ikpe afọ asaa ọzọ n'arụ nke ise, bụ nke mere ya afọ iri abụọ na isii zuruoke.

A ga-agukọta arụ ndị na afọ ọ ga-anọ na mkpọrọ ọnụ.

Kedụ ka o siri mee?

Ọ bụ n'ọnwa Ọgụst 12, 2015 ka Yinusa kpachiiri Ese na be ha na Yenegoa, kpọrọ ya laa Kano bụ na bee nke ya.

Ọ mere ya ka o si n'okpukperechi otu kraịst kpewezia Alakụba bụ ebe ọ nọzị lụọ ya dika nwunye ya mgbe ọ gụghachara ya aha, gụọ ya Aisha.

Ka nne Ese na nna ya begidere akwa, ndị otu NGO bụ ndị otu na-agbachitere ndị enweghị ike bịara tinye ọnụ ha na ndị uweojii.

Mgbe ahụ ka ha kpọchitere Ese na nke ndị be ha na Bayelsa mgbe ọ dịgoro ime na Maach 2016.

N'ọnwa May 2016, Ese mụọ nwa nwaanyị.

Ha mechere kpupu Yenusa ụlọikpe ebe ekpere ya ikpe ịtụmgbere nwatarakịrị, ịmetọ nwata, mwakpo, ntọ, ịnapụ ya ikike okpukperechi ya nakwa ịkpachi mmadụ n'ike.

Ikpe ahụ agaghị n'ihu ozugbo maka na okaikpe anọghị nso.

Mgbe ikpe ahụ malitere, Yanusa zara na ikpe amaghị ya n'ụlọikpe.

Ka obi dị ndị be Ese

Nna Ese, bụ Charles Oruru sị na obi di ya ụtọ maka mkpebi ya bụ ụlọikpe maka na-eziokwu pụtara ihe.

Ọ sị na oge niile ha gburu na ya bụ ikpe kemgbe 2015 alaghị n'iyi.

Charles sị na Ese na nwa ya nọ mma, na ya bụ ikpe ga-akuziri ndị ọzọ ihe na ịtụmgbere mmadụ adịghị mma.

A chụọla Charles Uwakwe onyeisi Neco

Ebe foto si, Neco

Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari chụrụ Ọkammụta Charles Uwakwe bụ onyeisi ngalaba ule a kpọrọ National Examinations Council (Neco), na mmadụ anọ ọzọ n'ọrụ, ụfọdụ ndị na-ajụ ebe mmiri ozuzo a si malite izo.

Nchọpụta BBC gosiri na ọ bụ kemgbe afọ 2018 ka gọọmentị sị ka Ọkammụta Uwakwe gaa nọrọ n'ụlọ ya dịka a malitere inyocha ya maka nrụrụaka.

N'oge ahụ, ebubo a wụsara Uwakwe n'isi bụ na o ji ọkwa ya mee etu o si sọ ya nakwa nrụrụaka ego.

Mmadụ abụọ ọrụ ha bụ ịchịkọta ego na igobata ihe sokwa nara nchụpụ nwamgbenta a.

Ebubo ahụ bụ na ndị a ji aghụghọ nye ọrụ ruru ijeri naịra 25, dịka ha anataghị ikike n'aka ministri na-ahụ maka agụmakwụkwọ maọbụ n'aka gọọmentị.

N'oge ahụ, ọ bụ Maazị Abubakar Gana ka e nyere ikike ịnọchịte anya Uwakwe dịka onyeisi Neco nwamgbenta.

Ka e mechara nnyocha a, Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ e ji chụọ Uwakwe na mmadụ anọ n'ọrụ.

Ndị a achụkọtara ha na Uwakwe bụ ndị gọọmentị sị na aka ha dị na nrụrụaka.

Ọ bụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Mee ka mkpebi Buhari maka Uwakwe na ndị ọzọ pụtara ihe.

Iwu Uwakwe dara, dịka gọọmentị siri dee, bụ nke Bekee kpọrọ Public Procurement Act (2007).

Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ ka e mechara nnyocha ka Onyeisiala Buhari kpebiri ịchụ Uwakwe n'ọrụ.

Dịka Neco siri kwuo, ndị ọzọ ihe a metụtara bụ onye na-arụ ka onyeisi ndị na-ahu maka ego bụ Maazị Bamidele Olure; Onyeisi na-ahụ maka igobata ihe bụ Dọkịnta Shina Adetona; Osote ya bụ Maazị Tayo Odukoya, nakwa onyeisi na-ahụ maka ihe banyere ikpe bụ Babatunde Aina.

Akụkọ ga-amasị gị: