Children's Day 2020: Ụfọdụ ozi mmegbu nne na nna na-ezi ụmụaka ha

Ụmụaka na-ekwu egwuregwu

Ebe foto si, Reuters

Ọ bụ eziokwu na oke na ọrụ dịịrị ụmụaka n'ime ezinaụlọ bụ ịgara nne na nna maọbụ onye nlekọta ha ozi.

Ozi ndị dịka; ịga zụta ihe, ịsa efere na akwa, ịza ụlọ na gburugburu ebe obibi dgz.

Mana o nwere oge maọbụ etu ọ ga-abụ na e were zie ụmụaka ozi ndị a, ọ bụrụzie mmegbu nye nwata ahụ.

Aha onyonyo,

Osita Amakaeze: Ndị ntorobia chọrọ ndị ndu ga-ezi ha ụzọ ọma

Otu onye ọkaiwu na-ahụ maka ikike dịrị ụmụaka bụ Dorothy Oleka kọwaara BBC Igbo ụfọdụ ozi ndị a bụ mmegbu nye ụmụaka.

Ọ sị na ụmụaka dịka iwu Naịjirịa si dị, bụ ndị gbara otu afọ ruo afọ iri na asaa.

Na ozi a na-ezi ụmụaka sitere n'agbụrụ nakwa obodo nwata ahụ si na ya pụta, mana ozi ndị na-ekwesighi ị na-ezi ụmụaka gụnyere;

1) Ire ahịa mbugharị

Oleka sị na nne na nna maọbụ onye nlekọta nwata ekwesịghị ibunye nwata ahịa ka ọ gaa na-ere n'okporoụzọ.

Na nke ahụ nwereike itinye nwata ahụ n'ọnọdụ ihe izendụ dịka ịtọrọ ya, ịwakpo ya, imetọ ya maọbụ ụgbọala ikutu nwata ahụ.

O kwuru na nke a bụ mmegbu nye nwata ahụ, ma kwukwa na iwu Naịjirịa megidere ya.

Ọ sị kama na ọ bụghị ihe ọjọọ ma nwata ahụ nọrọ n'ụlọọahịa nne na nna ya maọbụ onye nlekọta ya na-erere ha ahịa.

2) Ịkpọte nwata n'isi nke ụtụtụ

Ọ sị na ọ dị mma ka nwata teta ụra n'ụtụtụ ma kwado maka agụmakwụkwọ na ozi ndị ọzọ.

Mana ụfọdụ nne na nna na-akpọte ụmụaka n'ihe dịka elekere anọ nke isi ụtụtụ, tụmadị na nwata ahụ ehighi ụra oge ebe ọ na-aga ozi e dinyere ya.

Aha onyonyo,

Free education: Nwoke na-azụ ụmụaka 1000 n'akwụkwọ n'efu n'Aba

O kwuru na ịkpọte nwata n'ụdị oge ahụ n'isi ụtụtụ bụ mmegbu nye nwata ahụ, na oge kachasị mma iji kpọte nwata n'ụra bụ ihe dịka o jiri ọkara gafee elekere ise maọbụ n'elekere isii nke ụtụtụ.

3) Ịkpọpụ nwata ka ọ gbaa odibo

Ebe foto si, Getty Images

Ọkaiwu Oleka sị na ọ bụ ihe dị njọ ịkpọpụ nwata ka ọ gaa biri n'ụlọ onye ọ na-amaghị, karịsịa mgbe ọ na-erubeghi afọ iri na abụọ.

Na o nwee ihe ọjọọ mere nwata ahụ, na o nwereike ọ gaghị akọwali n'ihi na ọ mabeghi ihe dịka iwu si kwuo.

Kamana e nwereike ịkpọpụ nwata ka ọ gaa biri n'ụlọ ndị nwanne ha, mana nwata ahụ kwesịrị iru ihe dịka afọ iri na abụọ, n'oge ahụ ọ matatụla ihe ma nwee ike ikwu okwu ma ihe ọbụla mee ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ịkpọpụ odibo n'ụdị ka e nweta ego maọbụ enyemaka, bụ ịtụ nwata ahụ mgbere, na iwu Naịjirịa megidere ya.

4) Ịkwaba nwata n'ịlụ di maọbụ nwunye

Ọkaiwu Oleka sị na otu njem ọzọ a na-edunye ụmụaka dị njọ bụ ịlụ di maọbụ nwunye na-erughi oge ha.

Na ebe nke a kachasị ọjọọ bụ na mpaghara ugwu, mana ọ na-emekwa na mpaghara ọwụwanyanwụ.

Ọ sị na ụdị agwa a ga-eme ka nwata ahụ tụfuo oge nwata ya maọbụ ghara ịnụ ụtọ oge ya dịka nwata.

N'olu ya "Nwata anaghị abụ nne na nna nwata". Na nke a bụ mmegbu nye nwata ahụ.

O kwuru na ịkwaba nwata n'alụmdi na nwunye ga-eme ka nwata ahụ buru ibu karịrị ya, nke nwereike ibutere ya ịda mba.

5) Ịchọ ego n'aka nwata ahụ

Ụfọdụ nne na nna na-ebunye nwa ha ibu karịrị ya site n'ịchọ ego n'aka nwata.

Mgbe ụfọdụ, nwata ruo ihe dịka afọ iri na asaa, nne na nna ya ga-amalite ịtụ anya ego n'aka nwata ahụ.

Oleka sị na nke a nwereike ime ka nwata tinye anya n'ime ihe ọjọọ ka o nwee ike nwete ego ọ ga-enye nne na nna ya.

Na ọ bụkwa ezigbo mmegbu nye nwata ahụ ma rịọ ka nne na nna wepụ aka n'ụdịrị agwa dị etu a.