A ga-eji maka agụụ dị ghara ibunye onye tozuru ụgbọala? - Onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti

Chiji Collins

Ebe foto si, Facebook/Hon Chiji Collins

Maazị Chiji Collins bụ onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti ekwuola na a gaghị eji n'ihi na agụụ na agụ ndị mmadụ, ghara ibunye ndị tozuru ụgbọala.

Chiji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, kwuru nke a iji saa ajụjụ a jụrụ ya gbasara ihe mere e ji zụnye ndị ọkaikpe ụgbọala ebe e ji ndị mmadụ ụgwọ ọnwa na steeti ahụ.

Ọ sara sị "Ndị mmadụ ga-ekwu ihe masịrị ha. E kwuwe maka ụgbọala ndị ọkaikpe, ọ bụ ha bụ ndị mbụ na-agba ụgbọala?

"Onye ọrụ ọbụla nwere ụgwọ ọrụ ya. E nwere ihe ndị ị tozuru inweta dịka onye rụgiderela ọrụ rụruo ihe dịka ọrụ "Permanent Secretary", ụgbọala so n'ime ya.

"Ọ bụ makana agụụ na-agụ ndị mmadụ ka a ga-eji ghara ibunye ihe dịka Perm Sec ụgbọala ruru ya? Etu a ị na-arụ ọrụ na-arụsi ọrụ gị ike (ọ na-agwa onye ntaakụkọ BBC Igbo) ị ruo ibunye ụgbọala, agaghị ebunyezi gị ya makana agụụ na-agụ ndị Igbo? A ga-ebunye gị ya n'ihi na ọ bụ oke ruru gị.

"Ihe gbasara ndị ọkaikpe inweta ụgbọala, ọ bụghị ha niile nwetara ya, ọ bụ ndị tozuru ibunye ụgbọala ka e bunyere ụgbọala...n'ihi na onye rụrụ ọrụ na-eri ụgwọ ọrụ ya".

N'ihe gbasara ngagharị ndị mmadụ n'oge "lockdown"

O kwukwara na enweghi iwu Naịjiria megidere ndị Naịjirịa ịgagharị ebe ọbụla.

Na etu iwu Naịjirịa dị bụ na "Onye Igbo nwereike ịga ala Ugwu, ebe ndị Ugwu nwereike ịbịa Ala Igbo".

O kwuru nke a iji saa ajụjụ a jụrụ ya gbasara nchekwa na etu akụkọ si na-ekwu na ndị Ugwu si obodo ha na-abata ala Igbo.

N'ihe gbasara ụgwọ ọnwa,

Ọ sara ajụjụ a jụrụ gbasara ndị e ji ụgwọ na steeti ahụ, sị "a na-akwụ ụgwọ".

O kwukwara na gọvanọ Hope Uzodinma jibu nwayọ na-ahọpụta aha ndị anaghị arụ ọrụ na-eri ego nke a kpọrọ "ghost workers" ka ọ ghara ịkwụ ha ụgwọ, mana ugbua ọ họpụtachara ha, ọ na-akwụzị ndị ọrụ Bekee ụgwọ.

N'ihe gbasara okwu 'ịrụ ụlọakwụkwọ almajiri'

Chiji sara ajụjụ a jụrụ ya gbasara akụkọ fegharịrị n'ịntanetị na gọvanọ Uzodinma kwere nkwa ịrụ ụlọakwụkwọ ndị almajiri n'Imo steeti.

O kwuru sị "Ndị almajiri anọ n'Imo steeti?...nke a bụ okwu ụgha...enweghi ihe dị etu a".

Lee ihe ndị o kwuru n'uju ebe a:

Akụkọ ga-amasị gị: