Mbazulike Amechi: 'Ojukwu emetachaghị ya n'ihe banyere agha Biafra'

Mbazulike Amechi: 'Ojukwu emetachaghị ya n'ihe banyere agha Biafra'

Mbazulike Amechi bụ otu onye n'ime ndị so zọo nnwereonwe Naịjirịa n'afọ 1960, etinyela ọnụ n'ihe gbasara agha Biafra.

O kwuru na ọ gwara Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu na e nwere ebe ọ na-emetechaghị ya n’ihe gbasara agha a lụrụ.

Ọ kọwara na dịka ndị Ugwu na ndị Ndịda kpọkọrọ ndị ọchịchị ha na ndị agha ha ma jụọ ha “kedụ ka a ga-esi mee?” na Ojukwu bịara tinye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị Ọwụwa-anyanwụ dịka Michael Okpara, na nga.

O kwuru na ọ bụ ebe a ka Ojukwu si mehie, n’ihi na “Ọ bụrụ na anyị niile sonyere, anyị gaara enwe ụzọ anyị ga-esi kọwaara ndị otu anyị nọ n’Ugwu”.

O kwuru na ọ bụrụ na a kọwaara ndị a, na ụfọdụ n’ime ha “nwere akọnauche ga-aghọta ihe mere”.

Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Ebere Ekeopara