Okwu nhibe 'vigilante' n'Ọwụwa Anyanwụ ọ bịara na mmezu?

Ndị nchekwa 'Forest Rangers'

Ebe foto si, Enugu State government

Nkọwa foto,

Ndị otu 'Forest Rangers' nke Enugu steeti

Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ na onyeisi ndị uweojii enweela nkwekọrịta maka usoro a ga-eji hiwe otu nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Nkwekọrịta a gunyere na o bụ ndị uweojii ga-akụzịri ndị ahọpụtara ọrụ a.

Nke a na-eme dịka onyeisi nzụkọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Gọvanọ Dave Umahi na Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Mohammed Adamu nwere nzụkọ n'ekwe nti.

Umahi kwuru sị " Onyeisi ndị uweojii nke Naijirịa bụ Adamu na ndị gọvanọ ise nke ọwụwa anyanwụ ma onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo nwere mkparịta ụka maka otu nchekwa a. ndị ọzọ sonyere anyi bụ Emmanuel Iwuanyanwu. Jim Nwobodo na ụfọdụ ndị Eze odinala".

Umahi kwuru na ndị Gọvanọ ọwụwa anyawnụ niile sọ na ya bụ nkwekọrịta ma kọwaa na otu nchekwa ndị a ga-aga n'ime obodo maka nchekwa.

Etu o siri bido

Dịka izuụka ole na ole ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ bidoro ọtụ nchekwa nke ha ha kpọrọ "Ameotekun" n'ọnwa Janụarị afọ 2020 maka nwakpo ha sị na ndị ọchi ehi na-awakpo ndị nọ n'ime obodo.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ zutere ma nye ndị ụlọomeiwu ikike iwepụta iwu ga-akwado iwepụta otu nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ.

Nke a dị mkpa n'ihi na iwu Naijirịa akwadoghị ndị nchekwa ọzọ ma ọ bụghị ndị uweojii.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ zọpụrụ njem maka okwu a ma nwee nzụkọ ha na Adamu maka ihiwe otu nchekwa a.

Ndị kọmịshọna uweojii depụtara akwụkwọ nke gosiri usoro a ga-eji hiwe ya bụ otu.

Kama ndị gọvanọ ọwụwa anywnụ anabataghị ya n'ihi na ha sị na ọ bụghị ihe ha na onyeisi ha kpara.

Onye na-ahu maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji kọwara BBCIgbo etu ihe siri gaa.

Orji sị " ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ anabataghị usoro ndị uweojii wepụtara na mbụ n'ihi na ndị Kọmịshọna uweojii ji aka ha tinye ndị ga-anọ na ngalaba na-elekọta ndị otu nchekwa a".

Orji kọwara na nke a mere ka onyeisi ndị uweojii bụ kwuo na ọ bụ eziokwu ka ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na-ekwu.

O kwuru sị " Onyeisi ndị uweojii kwuru na ọ bụ eziokwu n'ihi na ihe ya na ndị gọvanọ kpara bụ ka ndị gọvanọ gaa n'ime obodo ma ghọpụta ndị ga-eso mee nchekwa a".

Dịka ọ dị ugbu a, ọ bụ otu iwu ga-achịkọta steeti niile nọ n'ọwụwa anyanwụ maka nke a.

Ufodu ihe so n'usoro a

  • Nke mbụ bụ na nkwekọrịta a gunyere na ọ bụ ndị uweojii ga-ekuziri ndị ahọpụtara etu ha ga-esi rụọ ya bu ọrụ nchekwa.
  • A ga-eziga ndị a na mpaghara dị iche iche na steeti niile dị n'ọwụwa anyanwụ.
  • Ihe ọzọ bụ kwa na a ga enwe ndị ọrụ ha bụ ihu na ndị otu nchekwa na-arụ ọrụ ha nkeọma na mpaghara ọchịchị niile, Umahi kwuru na ọ bụ ndị Eze Obodo, ndị uweojii na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ga eso maka nchikọta na ntuzi otu nchekwa a.
  • Ndị Gọvanmọ ọwụwa anyanwụ ga-ewpụta iwu nke ha ga-akpọ iwu "South-East Security" nke ga-eme ka iwu obodo kwagide ya bụ otu nchekwa .