Health Workers Hazard Allowance: Ego ole a kwụrụ maka "hazard fee " abụghị mkpa anyị ugbua - Onyeisi NMA

Ndịọrụ ahụike na-ekele ụmụ Naịjirịa n'ụbọchị ncheta ndịọrụ

Onyeisi otu chịkọtara dọkịta niile nọ na Naịjirịa bụ Innocent Utah ekwuola na ego ọrụ mgbadume gọọmenti kwadoro inye ndị ọrụ ahụịke dị mma mana ọ bụchaghị ihe ka ya na ndị otu ya

mkpa ugbua.

Utah kwuru na egole ọbụla gọọmenti etiti kwụrụ maka ọrụ mgbaụgbanụ ha na-arụ bụ ihe ha kwekọrịtara.

O kwuru na ihe ka ha mkpa bụ ka gọọmenti mee ihe ga-eme ka ahụike ụmụ Naịjirịa dị sam site na ihe ha ga-eme ka ọnọdụ ngalaba ahụike dị mma karịa etu ọ dị ugbua.

Ujah kwuru na gọọmenti kwetere na ọrịa covid-19 emeela ka ụwa hụ nnukwu nsogbu dị ngalaba ahụike Naịjirịa.

N'okwu ya, ugbua bụ oge ekwesiri iji wee tinyekwuo akụrụngwa eji agwọ ụmụ Naịjirịa ọrịa karịa etu esi eme na mbụ ma zụọkwa ndị ọrụ ahụike,

Ihe ndị kọmịshọna mpaghara ọwụwa anyanwu na-ekwu maka ụgwọ 'hazard' ha.

Kọmịshọna ahụike Abia steeti bụ Jonathan Osuji kwuru na steeti ha ebidolarị kamgbe na-akwụ ndị ọrụ ahụike ha ụgwọ ọrụ mberede kwa ọnwa.

O kwuru na gọọmenti etiti gwabụrụ steeti ka ha na-akwụ ndị ọrụ ahụike puku naira ise kwa ọnwa mana ka covid-19 sepụtara isi ha kwuru na ha ga-elebanya n'ego ahụ maka ịgbanwe ya.

Osuji kwuru na steeti ha amaghị ihe gọọmenti etiti kpebiri ugbua dịka ego mkpachanye ọrụ gbanụgbanụ ndị ọrụ ahụike mana Abia na-enye ndị niile na-arụ ebe a na-agwọ coronavirus ezigbo ego kwa izu ụka maka ntachiobi ha.

O kweghị ekwu egole ọ bụ.

Kọmịshọna ahụike nke Imo, Enugu, Ebonyi nakwa Anambra azaghị ekwenti ha mgbe anyị gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ha gbasara ya bụego mkpachanye ọrụ gbanụgbanụ.

Anyị gbalịkwara ịnụta n'ọnụ mịnịsta ahụike nke Naịjirịa bụ Ehanire Osagie mana o zaghị ekwenti ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị