Abịa state Roads: Ụkọchukwu edurula ndị ụka mee ngagharịiwe maka ajọ okporoụzọ n' Aba

Okechukwu Acha na ndị ụka ya

Ebe foto si, Okechukwu Acha

Nkọwa foto,

Okechukwu Acha na ndị ụka ya oge ha gara n'okporoụzọ Ohanku

Ụkọchukwu na-achịkọta ụka Metọdist nke 'Ụmụogele Circuit' dị na dayọsis Aba-East bụ Acha David Okechukwu, edurula ndị ụka ya gaa mee mbeku maka ajọ ọnọdụ okporoụzọ dị n'Aba, Abia.

Okechukwu, onye ji akwukwọ nso na abụ na ekpere zọchie n'okporoụzọ Ohanku, dị na Ngwa Road, Aba, ụbọchị Satọdee dọtara anya ọtụtụ ndị na-agafe dịka ọ gara ije n'ime idemmiri dọ n'okporoụzọ ahụ.

Ebe foto si, Okechukwu Acha

Okporoụzọ Ohanku bụ ụzọ jikọrọ ebe dị icheiche n'ala Igbo gụnyere Rivas steeti, Akwa-Ibom, Aba-Saụt na Aba-Nọt.

Ebe foto si, Uche Akolisa

Ihe ha mere bidoro wuwe na soshal midia n'ụbọchị Wednesde, Juun 10, dịka ọtụtụ ndị mmadụ ji ọnọdụ okporoụzọ dị n'Aba were mee isi akụkọ.

Ebe foto si, Okechukwu Acha

Nkọwa foto,

Ụkọchukwu Okechukwu Acha banyere ọdọmmiri nọ n'okporoụzọ Ohanku, dị n'Aba

Mana Ụkọchukwu Acha gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụghị ngagharịiwe ka ha mere, kama na ha gara kpọkuo Chineke ka o zitere ha onye ga-arụ okporoụzọ ahụ dịka ọnọdụ ya na-ata ndị na-azụ ahịa nakwa ndị bi na mpaghara ahụ ahụhụ.

Ọ sị, "Isi okwu anyị bụ Chineke napụta anyị, onye ọbụla ụzọ ahụ dị n'aka, metụ onye ahụ aka n'obi ka ọ bịa."

Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na ajọ ọnọdụ okporoụzọ Ohanku na-adọghachi aka elekere azụ n' atụmatụ dayosis ya nwere iwulite ụlọọgwụ na mpaghara ahụ.

Gee ihe o kwuru n'uju:

Aha onyonyo,

'Ngwa ngwa a rụrụ ụzọ , aga enwe mmepe akụnaụba'

Aha onyonyo,

South-East Roads: Ndị njem atọla n'Ugwuoba n'ihi ọjọọ

Ọnọdụ ọtụtụ okporoụzọ dị n'ala Igbo bụ ihe na-eri ọtụtụ ndị Igbo nri n'afọ kemgbe ọchịchị gafere n'aka ndị nkiti n'afọ 1999.

Ebe foto si, Okechukwu Acha

Nkọwa foto,

Ụkọchukwu Okechukwu Acha na ndị ụka ya

Cheta na n'afọ 2016, otu ụkọchukwu Angịlịkan bụ ụkọchukwu Uche Chinamerem, mere emume ncheta nnwereonwe Naijiria n'okporoụzọ 'Douglas Road' dị n'Owere, iji gosi ajọ ọnọdụ ụzọ ahụ nke ghọrọ ikpo ahịha oge ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: