June 12: Ọkpụrụkpụ okwu Onyeisiala Buhari kwuru na mgbasa ozi 'Democracy Day'

Ebe foto si, Nigerian Presidency
Muhammadu Buhari
Dịka Naịjirịa na-eme emume ncheta ụbọchị onye kwuo uche ya nke Bekee kpọrọ 'Democracy Day', onyeisiala Muhammadu Buhari gbasaara ụmụ Naịjirịa ozi n'onyonyoo TV.
Nke a bụ nke mbụ a na-eme emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Jun.
Buhari ji ohere mgbasa ozi ahụ kọwapụta ihe o mepụtarala kamgbe ọ malitere ọchịchị.
Okwukwara njikere ọ dị ịhụ na Naịjirịa gabigara ihe ọdachi niile na-echere ya aka mgba.
Lee ụfọdụ ihe o kwuru:
- Buhari kelere ndịọrụ ahụike nakwa ndị niile na-agba mbọ ịhụ na ọrịa coronavirus alaghị ụmụ Naịjirịa n'iyi.
- Onyeisiala kelekwara ndị niile na-enye aka ka ọchịchị onye kwuo iche ya na-esiwanye ike na Naịjirịa.
- O kwuru na GDP Naịjirịa gbagoro site n'otu pasentị na ụma (1.19%) n'afọ 2018 ruo pasentị abụọ na ụma (2.27%) na 2019, mana n'ihi ihe isi ike so ọrịa coronavirus, GDP agbadatala ruo otu pasentị na ụma asatọ (1.87%) na mbido afọ 2020.
- Ego Naịjirịa dopuru maka echi gbaliri site na ijeri dọla 33.42 ($33.42 billion) n'ọnwa April ruo ijeri dọla 36 ($36 billion) n'ọnwa Mee 2020.
- Gọọmentị eweela mmadụ puku ise n'ọrụ dịka 'Agro Rangers'. Nke a pụtara ndị nche ga na-echekwa ihe a kọrọ n'ubi nakwa ndị na-azụ anụmanụ.
- Ego Naịjirịa na-enweta site na ire cocoa nakwa mkpụrụ 'sesame' (sesame seeds) agbaliela ruo nde dọla 79.4 nakwa nde dọla 153
- Naịjirịa na-agba mbọ ibawanye azụmahịa ya na mba Afrịka ndị ọzọ.
- Na ngụkọ maka obodo ebe ọ kacha mfe ịzụ ahịa, Naịjirịa ji akara 25 gbagoo.
- Buhari kwukwara na ọ fọla obere ka a rụchaa ọdọụgbọelu dị n'Enugwu bụ nke e mechiburu iji rụgharịa ya
- Gọọmentị amalitela iwe ndị ntorobịa ruru 774,000 n'ọrụ iji belata enweghị ọrụ dị n'obodo.
- Ndị ntorobịa a ga-abụ otu puku mmadụ n'okpuru ọchịchị 774 dị na Naịjirịa
- Buhari gara n'ihu kwuo na ndịọrụ mgbochi nrụrụaka anwụchiela ihe karịrị mmadụ 1,400, ma napụta ha ego karịrị ijeri naịra 800.
- Onyeisiala kwuru na oke igbu mmadụ na Naịjirịa na-ewute ya. O kwuru na ya enyela ndị isi ọrụ nchekwa iwu ka ha nwụchie ndị niile aka ha dị n'ịkwafu ọbara na Naịjirịa
N'oge mbụ, a na-eme emume 'Democracy Day' n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee.
Ebe foto si, Getty Images
MKO Abiola bụ onye a na-ekwu meriri ntuliaka e mere na Jun 12 afọ 1993, mana onyeisiala Ibrahim Babangida kagburu ntuliaka ahụ
Ọ bụ n'ụbọchị ahụ n'afọ 1999 ka ndị agha nyefere ọchịchị n'aka ndị nkịtị.
Mana n'afọ 2019, Buhari kwuru na 'Democracy Day' ga-abụzị na June 12.
Ọbụ na June 12 afọ 1993 ka e mere ntuliaka na Naịjirịa mana onyeisiala oge ahụ bụ Ibrahim Babangida kagburu ya bụ ntuliaka.
Onye e che meriri ntuliaka ahụ bụ Moshood Abịọla larala mmụọ.
Nke a mere ka Buhari kwanyere Abiola ugwu na 2019 ma nye ya nzere GCFR (Grand Commander of the Federal Republic).