WAEC New Date: Lee mgbe na etu a ga esi lele ule nke 2020

Patrick Areghan(Onyeisi WAEC)

Ebe foto si, Waec Pro

Nkọwa foto,

Patrick Areghan(Onyeisi WAEC)

Ụlọọrụ West Africa Examination Council ekwuola na ha ga-elele ule West African Senior School Certificate Examination (WASSCE) nke afọ 2020.

Ọnụ na-ekwuru ngalaba ahụ bụ Demianus Ojijeogu gwara BBC Igbo na mgbe ọbụla gọọmenti ji wepụ mmachị amachiri ụlọakwụkwọ nakwa mmachi nke isi steeti banye steeti ọzọ maka coronavirus, na ha ga-amalite ule WAEC.

Mgbe anyị jụrụ ha nkwadobe ụmụakwụkwọ ga-ede ule a, Ojijeogu kwuru na ngalaba ha ga-enyekwu ụlọakwụkwọ dị iche iche ohere iji kwado ụmụakwụkwọ maka ule a.

O kwuru na ihe kacha WAEC mkpa ugbua bụ ndụ na ahụike ụmụakwụkwọ. N'okwu ya, "anyị ga-eso usoro ọbụla gọọmenti etiti wepụtara maka etu a ga-esi le ule a n'oge coronavirus."

Ihe na-echekasị nne na nna

Ebe foto si, Okey Okere

Mazi Okey Okere, nwa ya nọ na J.S.S 3 kwuru na agbanyeghị na nwa na-eji igwe intanet amụ akwụkwọ ugbua, na uche na-eche ya ma ọ dịla njikere ọfụma maka ile WAEC ma kanye ya ugbua.

Ọ gara n'ihu gosi nwute ya gbasara nne na nna na-enweghị ike ịkwụnụ ụgwọ igwe intanet ka ha nwa ha wee mụta akwụkwọ.

Okere kwuru na ọ ga-adị mma ka WAEC dọtịkwuo oge ha ga-enye ụlọakwụkwọ ka ha kwado ụmụakwụkwọ nọ na J.S.S 3 nakwa S.S 3 ọfụma.

Ndị nwe ụlọakwụkwọ na-eti mkpu nke ha

Nora Oguda bụ onyeisi ụlọakwụkwọ kwuru na kamgbe 'Lockdown' coronavirus butere, ọtụtụ ụmụakwụkwọ enweghị ohere iji intanet mụọ akwụkwọ maka ọgbatauhie so ya bia.

Oguda kwukwara na egwuregwu akpakọrọla uche ọtụtụ ụmụakwụkwọ ga-elele ule a nke mere na ọ ga-adị mma ka enyetukwuo ndị nkuzi ohere ma ewepụ mmachị ka ha kwado ụmụakwụkwọ ọfụma.

Otu nwata akwụkwọ anyị kpọrọ n'ekwenti kwuru na o chere na ya dị njikere ile WAEC site n'ihe mmụta ọ na-anata n'intaneti.

Cheta gọọmenti etiti machịrị ọgbakọ n'ụlọakwụkwọ kamgbe ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: