Herpes: Mata maka ọrịa nwerike ibute kansa akpa nwa.

Nsusu ọnụ

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-ekwu na otu nwoke akpọgala otu nwaanyị ụlọikpe maka na ọ gwaghị ya na ọ nwere ọrịa Herpes tupu ha esusuo ọnụ.

Nwoka a gbara agwụrụ na nwaanyị a ga-akwụ ya $236,000 maka ihe niile ọ gabigara kemgbe ọ sị na nwaanyị a bunyere ya bụ ọrịa.

Nwoke na-ekwu na otu ihe ga-akacha eri ya ego bụ ọgwụgwọ ya nke ọ sị ga-eri ya $181,700.

Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ jị ajụ sị , "Gịnị bụ ọrịa herpes a?".

Anyị kpọtụrụ dọkịta Prince Akahara ka ọ gbaa anyị ọgba n'eze maka ọrịa coronavirus.

Gịnị bụ Herpes?

Herpes bụ ọrịa a na-ebute site na mmekọ ahụ nke gụnyere nsusu ọnụ na mmekọ nwoke na nwaanyị.

Herpes dị ọtụtụ nke gunyere "Herpes Simplex virus type 1 (HSV-1) na "Herpes Simplex virus type 2 (HSV-2).

Anaghị agwọ ọrịa herpes agwọ nke mere na ọtụtụ ndi mmadụ ji atụ ya egwu.

I jị maa atụ , HSV-1 na-emekarị n'ọnụ ebe HSV-2 na-eme n'ike, ọtụ maọbụ amụ.

Kama onye bụ HSV-1 metụ amụ maọbụ ike na ọtụ mmadụ, onye ahụ ga-ebute HSV-1 n'ene ndị ahụ.

Nke ọzo bụkwa na mmadụ were ọnụ ya metụ onye bu HSV-2, HSV-2 ga-eme ya n'ọnụ.

Ihe ndị WHO na-ekwu maka Herpes?

Ndị ngalaba WHO ekwuola na mmadụ ijeri atọ na ụma na erubeghị afọ iri ise bụ HSV-1 na mba ụwa niile ebe mmadụ nde narị anọ na iri itolu na otu dị ihe dịka afọ iri na ise ruo afọ iri anọ na itolu bu HSV-2.

WHO kwukwara na onye nwere HSV-2 kacha nwee ike ibute ọrịa obirinajaọcha (HIV).

Ha kwukwara na onye nwere ọnye sitere na HSV-1 agaghị enweta ya bụ ọrịa na akụkọ ike ya.

Na-agbanyeghị na ọ naghị emekarị, kama nne nwereike ibunye nwa ya ọrịa herpes mgbe ọ na-amụ ya.

Herpes nwereike ị nọ n'ahụ mmadụ ọtụtụ afo ma onye ahụ agaghị amata.

Ked etu ị ga-esi ebute ọrịa Herpes?

Herpes kacha efe mmadụ site na mmeko ahụ di iche iche.

Kama onye bụ ọrịa herpes metụ ọnya, ọkọ ahụ maọbụ ebe ọkụ gbara ahụ mmadụ, onye ahụ nwereike ibute ọrịa Herpes.

Ụzọ ọzọ bụkwa na onye metu ọnye herpes aka ma were aka ahụ metụ onwe ya n'ọnụ, ike n'akụkụ dị ya nsọ maọbụ anya, onye ahụ nwereike ibute ọrịa herpes.

Eziokwu bụ na ọbụghị iwu na mmadụ ga-edina mmadụ tupu o bute ọrịa herpes.

Ụfọdụ ndị na-ebute ya bụ ọrịa site mgbe okenye dịka nne maọbụ nna nwere Herpes nke ọnụ susuru her ọnụ, her nwereike ibute ọrịe herpes nke ọnụ.

Ọ bụghị kwa iwu na mmadụ ga-ahụ ọnya tupu ị mara na ị bu ọrịa Herpes n'ihi na onwere ike izo n'ahụ mmadụ.

Ihe Dokita Akagharasị mmadụ niile kwesiri ị mata maka ọrịa Herpes.

Dọkịta aha ya bụ Prince Akahara kwuru na nje Herbes nwereike ị nọ n'ahụ gị ma o nweghị ihe ọ ga-eme gị.

Ọ kọwara na ọ dị ebe niile n'ụwa.

Akahara kwuru na nke kacha dị kwa ire bụ HPV-6, HPV-12 na HPV-8 nke nwereike ibute ọrịa kansa nke akpanwa kama enwere ọgwụ mgbochi maka nje ndị nke a.

O kwuru sị " Iyi okpunnabuenyi na-enyere aka igbochi mmadụ ibute nje a mgbe ha na mmadụ na-enwe mmekọ".

Kama ọ kwuru na ihe kachasị mkpa bụ ka ndị mmadụ hara inwe ọtụtụ ndị ha na-enwe mmekọ.

Akahara kwuru sị "ewepụ ndị a m kpọrọ aha, nje Herpes anaghị egbu mmadụ".

O kwukwara na dịka ọ bụ dọkịta, na ọ hụla ọtụtụ ndi mmadụ nwere ọnya na mpaghara ike ha maka ya bụ ọrịa ma ha amaghị na ha nwere ya.

O kwuru sị "N'ime mmadụ otu puku, otu onye nwereike i bu ya".

Akụkọ ndị ga-amasị gị: