Rape in Nigeria: Akụkọ ụmụagbọghọ ise a wakporo ma gbuo n'ọdị nso a

Uwavera Omozuwa na Bello Barakat

Ebe foto si, Facebook

N'oge gboo, iwakpo nwaanyị ma metọọ ya n'ike bụ arụ ka arụ ala ji akụgbu mmadụ.

Onye ọbụla mere ihe dị otu ahụ n'obodo ga-eji anya ya hụ ntị ya.

Mana ugbua, ọ dịzị ka ya bụ arụ a na-achọzị ịgba afọ wee bụrụzie omenala.

N'ọdịnso a, a nụla akụkọ otu e si wakpo ma metọọ ọtụtụ ụmụagbọghọ na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.

Ụfọdụ n'ime ha nwụkwara n'aka ndị omekome ahụ metọrọ ha n'ike.

Mana ihe dị nnukwu mwute bụ na ụfọdụ ndị na-arụ ala a enwebeghị nke ndị ọrụ nchekwa nwuchirila.

Lee ụfọdụ n'ime ụmụagbọghọ ndị ahụ:

1) Vera Uwaila Omosuwa

Ebe foto si, uwavera omozuwa/facebook

Uwaila bụ nwaagbọghọ gbara afọ 22.

Ọ bụ onye Edo steeti, ma bụrụkwa nwata akwụkwọ na mahadum nke Benin.

O tebeghi aka Uwaila banyere mahadum ahụ tupu o zute ọnwụ ya.

Akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ n'ime otu ụlọụka Redeemed Christian Church of God ka a wakporo ya, metọọ ya ma gbuo ya.

Mana ndị uweojii mechara nwuchie otu onye ha sị na aka ya dị n'ọnwụ nwaagbọghọ ahụ.

N'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jun ka akụkọ gbasara Uwaila Omosuwa pụtara.

2) Bello Barakat

Ebe foto si, Twitter/Justice for Barakat

N'ụbọchị anọ nke ọnwa Jun, akụkọ ọzọ pụtakwara gbasara nwaagbọghọ ọzọ aha ya bụ Bello Barakat.

Barakat, onye dị afọ 18, na nne na nna ya bi n'Ibadan dị n'Oyo steeti.

Aha onyonyo,

Mwakpo ụmụnwaanyị

Nna ya bụ Kasimu Bello gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ebe Barakat na-asa ahụ ka ndi ohi bịara be ha bakwuru ya metọọ ya n'ike ma were mma sụkachaa ya ahụ.

Ndị uweojii kwuru na ha ka na-eme nnyocha, mana ha ejidebeghi onye ọbụla so kpaa arụ a.

3) Jennifer

Nke a mere na Kaduna oge ụmụokorobịa ise wakporo ma metọọ otu nwaagbọghọ aha ya bụ Jennifer.

Jennifer gbara naanị afọ 18.

Ndị ezinụlọ Jennifer wepuru okwu ahụ na nke ndị uweojii, mana mgbe ọ dị ha ka onweghị ihe ga-apụta na ya, ha tinyere onyonyo ya na soshal midia.

Ndị uweojii mechara kwuo na ha anwụchiela mmadụ so wakpo Jennifer, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ ka nọ n'ọsọ.

4) Azeezat Shomuyiwa

Azeezat bụ nwata akwụkwọ na Mahadum Ibadan.

Akụkọ kwuru na ndị ekperima metọrọ ya tupu ha ewere nnukwu nkume kugbuo ya.

Mana ndị uweojii kwuru na ha hụrụ nkume e ji gbuọ nwaagbọghọ ahụ, mana ọbụghị mmetọ ka e metọrọ ya.

5) Grace Oshiagwu

Akụkọ pụtara ụbọchị Sọnde bụ maka nwaagbọghọ dị afọ 21 aha ya bụ Grace Oshiagwu.

Akụkọ kwuru na ndị omekome wakporo Grace n'abalị Satọde, metọọ ya ma gbuo ya.

Mana Kazeem Bolarinwa bụ onyeisi okpuru ọchịchị ebe ihe a mere, kwuru na ọnwụ grace abụghị maka mmetọ e metọrọ ya.

O kwuru na ọ bụ ndị ji mmadụ na-agwọ ọgwụ gburu nwaagbọghọ ahụ ma chọọ iji mmetọ kpuchie ya iji megharịa ndị uweojii anya.

Ebe foto si, Amnesty International

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ndị ntorobịa emeela ngagharịiwe maka oke mwakpo ụmụnwaanyị na Naịjirịa

Ndị gọvanọ steeti niile dị na Naịjirịa ekwuola na ịwakpo ụmụnwaanyị bụzị ọnọdụ gbatagbata na Naịjirịa.

Ha kwuru na ha ga-eme ihe niile ha nwere ike iji kwụsị ya bụ ajọ ihe.

Mana ihe ọtụtụ ndị mmadụ chọrọ bụ ịhụ na ndị aka ha dị na ihe ọjọọ ndị a ga-anata ntaramahụhụ kwesịrị ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị