Naira Devaluation: Gịnị ka ọ pụtara maka ndị nkịtị?

Naira Devaluation: Gịnị ka ọ pụtara maka ndị nkịtị?

Ụlọakụ etiti (Central Bank of Nigeria) ebutuola ego Naịjirịa ka ọ bụrụzie naịra narị atọ na iri asatọ (N380) maka otu dọla.

E ji pasentị 24.6 butuo ya site na N360 ọ dịbu na mbụ.

Nke a na-abịa dịka ọrịa coronavirus nakwa ihe ndị ọzọ na-emekpa akụnaụba Naịjirịa ahụ.

Ọnụahịa mmanụ agbidi nke bụkarị ihe na-enye Naịjirịa ego, na-ada ada na mbaụwa. Nke a mere ka akụnaụba Naịjirịa na-agbadakwa agbada.

Ọtụtụ ndị ọkachamara dị icheiche ekwuola uche ha maka mbutu naịra bụ nke Bekee kpọrọ 'devaluation'.

Ụfọdụ sị na ọ bụ ihe e kwesịrị ime, ebe ndị ọzọ sị na ọ ga-eme ka ahụhụ na ihe isi ike kawanye njọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Onyeisi ụlọakụ etiti, Godwin Emefiele

Mmadụ dịka Sanusi Lamido, bụbu onyeisi CBN, kwuru na ya bụ mbutu naịra adịghị mma n'oge a, mana Kingsley Moghalu, onye rụburu ọrụ dịka osote onyeisi CBN, sị na ọ ka mma ka e butuo ya.

Mana ndị nkịtị aghọtachaghị ihe okwu a bụ 'devaluation' pụtara maọbụ etu ọ ga-esi metụta ego akpa ha.

'Devaluation' ọbụ ihe ọjọọ ka ọ bụ ihe ọma

Nkọwa foto,

Mbutu naịra ga-eme ka ọnụahịa ihe gbalie elu bụ nke bekee kpọrọ 'inflation'

Chidi Lemchi, onye ihe banyere ego na akụnaụba doro anya, kọwara na mbutu naịra mara mma ma jọkwaa njọ.

Lemchi kwuru na "mbutu ego ga-eme ka ọnụego mbubata ngwaahịa gbalie, nke ga-eme ka ọnụahịa ihe niile gbalie", bụ nke Bekee kpọrọ 'inflation'.

"Ọ ga-emekwa ka ibite ego raa ahụ maka na ndị na-ebinye ego ga-etinye ego na ọmụrụnwa ha na-ana."

Nke a pụtara na ndị ihe ga-esiri ndị nkịtị ike karịa ka ọ dị na mbụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Devaluation nwere ike ime ka ndị si mba ofesi bata Naịjirịa bịa tinye ego ha, nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee ọrụ

Mana Lemchi kọwara na ya bụ 'devaluation' nwere ike ime ka ndị si mba ofesi bata na Naịjirịa ma tinye ego ha, maka na ọ ga-eme ka ọmụrụnwa ha gbalie.

"Ọ bụrụ na ọtụtụ ụlọọrụ si mba ofesi bata Naịjirịa mepee ụlọọrụ ha ebe a, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ nweta ọrụ."

Ya bụ na mbutu naịra ga-eme ka ọnụahịa ihe oriri na ihe ndị ọzọ gbalie, mana ọ ga-akara akụnụba Naịjirịa mma n'ọdịnihu.