Azubuike Ekwegbalu: 'Ndị ọjọọ gbara na be nwaanne m magbuo ya' - Chief Ekwegbalu

Azubuike Ekwegbalu: 'Ndị ọjọọ gbara na be nwaanne m magbuo ya' - Chief Ekwegbalu

Akụkọ BBC Igbo nwetere n'ụtụtụ Monde bụ na ndị ekperima amabeghi ndị ha bụ gara na be Azubuike Ekwegbalu n'elekere mbụ nke isi ụtụtụ were mma magbuo ya.

Azubuike Ekwegbalu bụ onye enyemaka pụrụiche nke Gọvanọ Willie Obiano nke Anambra steeti, n'okwu gbasara nchekwa.

BBC Igbo kpọtụrụ nwanne ya nwoke bụ Ikechukwu Ekwegbalu bụkwa onyeisi ndị ahịa n'Anambra steeti niile gbaa gburugburu.

O kwuru na ndị uweojii Anambra steeti ka na-eme nnyocha gbasara ọnwụ nwaamadị ahụ. Ọ bụ mgbe ha mechere ya bụ nnyocha ka ha ga-amata nke bụ eziokwu.

Nwa Chief Ekwegbalu bụ Nnamdi Ekwegbalu kwuru na ọnwụ nwaanne nna ya dara ha na mberede maka na ọtụtụ ndị ezinaụla ha tụkwasara ya obi.

Ọ kọwara ka ndị ajọ mmadụ a siri bata n'ụlọ ya gbuo ya.

Azubuike ji nwaanyị na ụmụ atọ tupu ọ hapụ ụwa.