Diezani Allison-Madueke: Ndụmọdụ o nyere ndị Yahoo-Yahoo akpaliela iwe ndị mmadụ

Former Nigeria Minister of Petroleum Resources Alison Madueke

Ebe foto si, SAMUEL KUBANI

Diezani Allision-Madueke bụbu Minista na-ahụ maka njem tupu o nwete ohere rụkwa ọrụ dịka Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị tupu ọ bụrụ onye ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na mpụ bụ Economic and Finaincial Crimes Commission (EFCC) na-akpụkarị n'onu banyere nrụrụaka n'ọrụ ọha.

Odoziaku Allision-Madueke, bụ nwunye aka chịbụrụ Anambra steeti n'oge ndị agha bụ Allision Madueke, rapụrụ Naịjirịa gawa Briten ka ọchịchị Goodluck Jonathan na-abịa na njedebe.

Kamgbe ahụ, EFCC ebola ya ebubo na aka ya dị na nde naịra 362 a na-achọ achọ n'akụnụba Naịjirịa nke ha siri a chọrọ iji mee ka ntụlkịaka emere ganyere ha.

EFCC chọrọ ka Diezani si ofesi lọta Naịjirịa bịa zara ọnụ ya. Ha natakwara ụlọikpe ikike ka gọọmentị napụ ya ọlaedo ya ruru nde dọla 40.

Ọtụtụ ụlọ Allison-Madueke nọkwa gọọmentị Naịjirịa n'aka, mana o kwebeghi ịlọta Naịjirịa, nke mere ikpe niile a na-ekpe ya na-eme n'azụ ya.

Mana, dịka okwu nke ahụ ka nọ n'elu ekwu ọkụ asụ pụtụpụtụ, Allison-Madueke malitere iwu ọzọ na Twiter Naijirịa dịka o mere ihe onyonyo o ji adọ ụmụ okoroọbịa Naịjirịa aka na ntị ka ha kpachara anya ha banyere nrụrụaka eji Yahoo Yahoo mara.

Ụfọdụ mmadụ ji iwe saa ihe a Allison-Madueke dere site were na-ekwu na onye nwere azịza banyere mpụ ekwesịghị ịnye ndụmọdụ banyere ịkwụsị mpụ.

Ebe ka ọ nọ kwuo okwu a?

Ọ bụ na otu emume otu a kpọrọ "Ijaw National Development Group" haziri ka Allison-Madueke nọ kwuo okwu a dịka ọ na-etinye ọnụ n'okwu omenala.

Ọ sị: "ihe mere ndị mmadụ ejighi eso omenala eme ihe ziri ezi bụ na ha na-eji ndị na-eme Yahoo Yahoo eme ndị ha na-akwanyere ugwu."

Allison-Madueke kwukwara na ọ bụ ndị na-eme nrụrụaka n'ịntanetị na-enye Naịjirịa ajọ aha.

Aka Chịbụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan sokwa gaa ya bụ emume emere n'ịntanetị.