Ronald Koeman: Ọ ga-ebulinwu Barcelona elu ọzọ?

Koeman na Van Gaal

Ebe foto si, EPA

Ronald Bignan Koeman na-achịkọta otu egwuregwu mba Nedalandị anọchiela Quique Setien dịka onye nchịkọta Barcelona.

Cheta na a chụrụ Setien dịka otu Bayern Munich ji ọkpụ goolu asatọ asatara naanị abụọ gbaara Barcelona ụgbọ nwamkpi n'abali ole na ole gara aga n'asọmpi Champions League nke afọ 2020.

Josep Bartomeu bụ onyeisi otu egwuregwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na ihe niile gaa n'anya ya, na Koeman ga-anọ n'ọkwa onye nchịkọta ahụ ruo afọ 2021.

Ị chọrọ ịma onye Koeman a bụ? Lee ihe anyị chọpụtara maka ya:

Ebe foto si, Getty Images

  • A mụrụ ya n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị n'afọ 1963
  • Dịka ọgbabọọlụ, o so otu egwuregwu gụnyere Ajax, PSV Eindhoven nakwa Barcelona bulie ọtụtụ iko
  • O ritere Iko Eredivisie n'Ajax n'afọ 1984/85, Iko Eredivisie atọ na PSV Eindhoven site n'afọ 1986 ruo 1988/89 nakwa Iko Champions League n'afọ 1988; na Barcelona o ritere Iko La Liga ugboro anọ na-eso ibe ya site n'afọ 1991 ruo 1994; o nyerela Barcelona otu goolu mere ka ha bulie iko Champions League nke mbụ ha na-erite n'afọ 1992
  • O so mba Nedalandị bulie iko UEFA Euro nke afọ 1988
  • Dịka ọgbabọolụ, o nyere goolu 207 site na mbido ruo na ngwụcha; 67 n'ime ya bụ Barcelona ka o nyerela ya site n'afọ 1989 ruo afọ 1995
  • Ọ wụsara ọwa dịka ọgbabọọlụ n'afọ 1997, ka ọ gbachaara Feyenoord bọọlụ
  • Koeman gbaara otu egwuregwu mba Nedalandị bọọlụ site n'afọ 1982 ruo afọ 1994
  • Koeman, nwanne ya nwoke bụ Erwin nakwa nna ya bụ Martin gbaara mba ha bụ Nedalandị bọọlụ
  • Nwa ya nwoke ọ gụrụ aha ya, bụkwa oche goolu n'otu egwuregwu FC Oss dị na mba Nedalands
  • Dịka onye nchịkọta, o buliela Iko Eredivisie abụọ n'Ajax n'afọ 2001/02 na 2003/04 nakwa otu ugboro na PSV Eindhoven n'afọ 2006/07; o ritekwara Iko Copa del Rey nke afọ 2007/08 mgbe ọ na-achịkọta otu egwuregwu Valencia
  • Ọ chịkọkwara otu egwuregwu Southampton site n'afọ 2014 ruo 2016 nakwa Everton site n'afọ 2016 ruo 2017
  • Ọ ka bụ onye nchịkọta otu egwuregwu mba Nedalandị bụ ndị ọ malitere ịchịkọta kemgbe afọ 2018.

Ị hụla na o nyerela ndị ọ gbaara bọọlụ aka ibute iko mgbe ọ chịkọtara ha, ọ dị gị ka ọ ga-eme ọfụma na Barcelona ma ọ bụrụ na ọ gaa ịchị ha?