Fani-Kayode enyela Daily Trust ịzuụka abụọ ịkwụ ya ijeri naịra isii maọbụ chere ya n'ụlọikpe

FFK

Ebe foto si, Screenshot/Twitter video

Onye okaikpe Femi Fani-Kayode agwala ndị ụlọọrụ Media Trust Limited bụ ndị nwe akwụkwọ akụkọ Daily Trusty ha bịa ka ha kpaa ka ha ga-esi kwụọ ya ijeri Naịra isii maka ịmetọ aha ya.

O kwuru nke a n'akwụkwọ ọkaikpe ya degara onyeisi ụlọọrụ ahụ ụnyaahụ bụ ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọgọstụ.

Na ya bụ akwụkwọ nke onye ọkaikpe ya bụ Adeola Adesipe tinyere aka bụ ọsịsa akụkọ Daily Trust dere n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ bụ ebe ha kpọrọ FFK 'onye na-ese anwụrụike na-ezo onwe ya n'ezigbo uwe".

Onye dere ya bụ akụkọ ji okwu a saa FFK ahụ maka mkparị ọ kparịrị onye ọrụ ha bụ Charles Eyo na Kalaba dịka ọ jụchara ya ajụjụ ebe FFK si enwete ego o ji eme njem ọ na-eme na mpaghara ọdịdanyanwu.

Ebe foto si, Chris Okereke

Onye dere ya bụ akụkọ kwuru na FFK bụ onye "gara Mahadum Cambridge bụbu onye e ji anwụrụike mara, nakwa ọ gara nata ọgwụgwọ na mba Ghana mana ọ gbakebeghị."

N'ihi ya ka FFK ji sị ndị ụlọọrụ Daily Trust ha kwụọ ya ijeri naịra isii iji hichapụ ya bụ unyiri ha tere ya n'ihu ma dekwaa akwụkwọ rịọ mgbghara n'akwụkwọ akụkọ atọ, nke gụnyere nke ha.

Ya bụ minista njem ụgbọelu ochie sị na ya nyere ha izuụka abụọ iji mee nke a maọbụ ha kee ajị n'ume chebiri ya n'ụlọikpe.

Emechuola m onwe m na ezinụlọ m ihu

Ebe foto si, Fani-Kayode/Facebook

Nkọwa foto,

Femi Fani-Kayode

Femi Fani-Kayode, onye rụburu ọrụ ka mịnịsta na-elekọta njem ụgbọelu na Naịjirịa, arịọla mgbaghara pụrụ iche maka ịkparị onye ntaakụkọ.

Ọ rịọrọ mgbaghara a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Uyo, isi obodo Akwa Ibom steeti.

Fani-Kayode kwuru na ihere onwe ya na-eme ya maka etu ya si kpasa onye ntaakụkọ agwa.

O kwuru sị: "N'obi m niile, ana m arịọ mgbaghara maka etu m si gwa onye ntaakụkọ ahụ okwu."

"Eji m ohere a na-arịọ ya, ka ọ gbaghara m, ejikwa m n'aka na ọ ga-agbaghara m."

"Emechuru m onwe m, ndị ezinụlọ m na ndị enyi m ihu, nakwa ndị niile na-akwanyeburu m ugwu."

"Onweghi onye ọchịchị maọbụ onye a ma ama kwesịrị ịkpa agwa etu m si kpaa agwa."

"O wutere m, biko gbagharanụ m, agaghị m emekwa etu ahụ ọzọ."

Ụnụ azakwala oku Fani-Kayode kpọrọ - NUJ

Ebe foto si, Femi Fani-Kayode/Facebok

Nkọwa foto,

Femi Fani-Kayode na Gọvanọ Akwa Ibom bụ Emmanuel Udom

Cheta na otu ọdịmma ndị ntaakụkọ na Naịjirịa nke Bekee kpọrọ "Nigerian Union of Journalists" (NUJ) nke Akwa Ibom steeti, dọrọ ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha ghara ịza oku Femi Fani-Kayode kpọrọ ha.

N'akwụkwọ mgbasaozi onyeisioche na onye ode akwụkwọ NUJ n'Akwa Ibom binyere aka, ha sị na ha enyela iwu ka ndị ntaakụkọ niile gbajọọ oku Maazị Fani-Kayode kpọrọ n'ebe ọbụla na steeti ahụ.

NUJ sị na ha esoghi na njem nleta Maazị Fani-Kayode na-eme ugbua.

Amos Etuk bu onyeisioche NUJ n'Akwa Ibom ebe Dominic Akpan bụ Ode Akwụkwọ

A gbagharala m Fani-Kayode maka mkparị ọ kparịrị m - Charles Eyo

Aha onyonyo,

'Ụdị mkparị Fani-Kayode nyere o nwebeghị onye nyere ya'

Charles Eyo, onye ntaakụkọ Daily Trust Femi Kayode kparịrị n'ihe onye onye fegharịrị na social midia na nsonso ekwuola na o nwebeghị onye gwara ya ụdị okwu ahụ n'ụwa.

Eyo gwara BBC Igbo na Femi Fani-Kayode kwesịrị izitere ya ozi mgbaghara ụdị ajọ okwu ọ gwara ya oge ha na-eme mkparịta ụka mana dịka onye ụka, na ya agbagharala ya.

Cheta na okwu Femi Fani-Kayode bụbụ Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu gwara Maazị Eyo wuru ewu na soshal midia sị na ọ bụ "onye iberibe" na ọ na-ajụ ya "ajụjụ iberibe."

Okwu ahụ mere ọtụtụ ndị mmadụ ịkwa Fani-Kayode emu ,ebe ụfọdụ gụnyere ndị nwelitere isi n'ọrụ ntaakụkọ kporo oku ka ọ rịọ onye ntaakụkọ ahụ.

Ebe foto si, Charles Eyo

Maazị Eyo sị na ọ bụ maka etu ndị otu ya jiri tinye ọnụ na ya bụ okwu n'oge ihe mere kpatara ya jiri rịọ Maazị Fani-Kayode n'oge ahụ.

Ọ gakwara n'ihu sị na ya ga-agbaghara makana ya bụ onye ụkọchukwu n'ụka a kpọrọ Brotherhood of the Cross and Star.

Ndị ọrụ na-eru n'okwu banyere ntaakụkọ si Fani-Kayode rịọ ezigbote mgbaghara

Ebe foto si, Simon Kolawole Facebook/BBC

Ndị ọnụ na-eru okwu na ngalaba ntaakụkọ Naịjirịa etinyela ọnụ n'okwu

Onye nwe ụlọọrụ "The Cable" bụ Simon Kolawale kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa anaghị achọ ka a jụọ ha ajụjụ tara akpụ, ya mere o ji adị ka ọ bụ ihe ọjọọ ka onye jụrụ ha mere wee jụọ ya bụ ajụjụ.

O kwuru na udiri ihe a mee, na ọ dị mma ka onye ntaakụkọ ahụ kwụdosie ike n'ajụju ya ebe ndị otu ya kwesiri inye ya ezi nkwado.

Tony Uranta bụ onye nlekọta Channels TV kwuru na Femi Fani Kayode kwesiri ịpụtakwa n'onyonyo ọzọ gosi ụwa ebe ọ na-arịọ Eyo mgbaghara.

O kwuru na ajụjụ onye ntaakụkọ ahụ jụrụ dị mma nke mere ka Kayode kopu mana ọ dịghị mma etu o si tụwa egwu mgbe Kayode bawara ya mba.

O kwuru na onye ntaakụkọ ọbụla kwesiri iji ọrụ ya na-eme ngala.

Abia n'ebe onye nwe ụlọọrụ nke Kayode kwuru ka ọ gwa ka ọ chụọ Eyo, Uranta kwuru na onyeisi ahụ kwesiri ịma na ọ bụ ọrụ ka Eyo na-arụ ghara ị danyere Kayode.

Femi Fani Kayode arịọla Charles Eyo ọ kpọrọ onye nzuzu mgbaghara

Ebe foto si, @ReallFemi Fani-Kayode

Femi Fani-Kayode arịọla Charles Eyo bụ onye ntaakụkọ mgbaghara maka mmebọ o mebọrọ ya mgbe ọ jụrụ ya ajụjụ n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ o kpokọbara na Calabar.

Kayode depụtara mgbaghara na twitter ya ma na-ekwu na o nweghị mgbe o ji kwuo na ọ ga-ememina Eyo.

O kwukwara na ọ ma na-agwa ya akpasuola ọtụtụ ndị mmadụ iwe mana ọ kpofuola ihe ahụ merenụ ma na-aga n'ihu ime njem ngagharị ya n'ọwụwa anyanwụ.

"Ihe ọbụla mere Charles Eyo, onye ntakụkọ anyị dị n'isi Femi Fani-Kayode"- Daily Trust

Ebe foto si, Charles Eyo

Cheta na ụlọ ọrụ Media Trust Limited, ndị na-edepụta akwụkwọ ozi Daily Trust katọrọ etu Femi-Fani Kayode si were ọnụ yọchaa onye ntaakụkọ ha bụ Charles Eyo n'onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia.

Ihe a mere na Calabar, Cross River State n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọgọstụ n'ụlọ oriri na nkwarị ebe Kayode na ndị ntaakụkọ na-enwe mparịtaụka.

Ha kwuru na obi adịghị ha mma na ebechapụrụ ajụjụ onye ntaakụkọ jụrụ kpatara ọsịsa ahụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite kparịwa Eyo.

Ha na-ekwusi ike na ha kwadoro Eyo n'ihe o mere maka na ọ bụ ọrụ ya ka ọ na-arụ.

Daily Trust kwuru na ihe Kayode mere Eyo gosiri na o nweghị nkwanye ugwu nye ndị ntaakụkọ.

Ha jịkwa ohere a agwa ụwa na ihe ọbụla mere Charles Eyo ugbua bụ n'isi Kayode ka ọ dị maka etu o si gwa ya okwu ike.

Ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a mere n'elu soshal midia.

Ihe m jụrụ Fani-Kayode kpasuru ya iwe- Onye ntaakụkọ 'Daily Trust'

Aha onyonyo,

Femi Fani Kayode: Ihe m jụrụ ya gbawara ya obi

Onye ntaakụkọ Daily Trust bụ Charles Eyo kọwara ihe butere mkparị Femi Fani Kayode bụbụ Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu nyere ya n'ihe onyonyo na-ewu ewu na soshal midia.

N'ihe onynyo ahụ, Femi Fani-Kayode ji iwe bara onye ntaakụkọ Eyo mba sị ya na ọ na-ajụ "ajụjụ iberibe."

Na mkparịtaụka BBC na onye ntaakụkọ ahụ nwere n'ekwentị,o kwuru na ajụjụ ya juru so n'ihe Fani Kayode gwara ha bụ ndị ntakụkọ ọ kpọrọ oku na ya agaala leta ọrụ iri atọ na atọ nke Gọvanọ Ben Ayade nke Krọs Rịva rụrụ were hụ na ọ dị mma, maa gakwa hụ ihe gọvanọ steeti isii ndị ọzọ rụrụ.

"M were jụọ ya sị, "Ị gwabeghị anyị onye na-akwụ ụgwọ njem ndị a ị gara?"

Ya bụ ajụjụ mere ka Femi Kani Kayode gbakaa ma bara ya ezi mba kwee nkwa ịkpesara ndị nwe ụlọọrụ Daily Trust.

Eyo gbara ama na dịka Fani Kayode kwere nkwa ịchụ ya n'ọrụ n'ihe onyonyo ahụ, na ọ kpọrọ onye nwe ụlọọrụ ha ma gwa ha ka ha chụọ ya n'ọrụ mana ha achụghị ya.

O kwuru na onyeisi ọrụ ya ewepụtaghị akụkọ ihe ahụ mere n'ụbọchị Tọzde dịka ya wegara ha akụkọ ahụ.

Kama na ha mechara rịọ ya mgbaghara oge ihe onyonyo ahụ bidoro wuwe na soshal midia.

Eyo gara n'ihu kwuo na o wuteghị ya na ya jụrụ Fani Kayode ajụjụ ahụ, kama na ihe wutere ya bụ na ya sị Fani-Kayode ya ewela iwe ka ya jụchara ya bụ ajụjụ.