Deregulation: Ọnụ ego 'fuel' dịzị n'aka ndị na-ere ya

Aha onyonyo,

"Gọomentị anaghị ajụ ka anyị enwete ego anyị ga-akwụ n'ego ha tinyere na mmanụ ụgbọala"

Ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa arịala ugbua, site na naịra 141 ruo naịra 151, mana ndị mmadụ na-ekwu na ha zụtara ya n'ọnụ naịra 160 n'ụtụtụ Tọzde.

Nke a bụ maka atụmatụ ọhụrụ nke gọọmentị etiti wepụtara a na-akpọ 'deregulation'.

Oge niile ka gọọmentị Naịjirịa na-ekwu maka 'deregulation', ọkachasị n'ihe gbasara mmepụta mmanụ ụgbọala nke Bekee kpọrọ 'Premium Motor Spirit' (PMS) maọbụ 'petrol'.

Mana gịnị ka ya bụ okwu 'deregulation' pụtara?

'Deregulation' pụtara na gọọmentị ga-esepụ aka ha kpam kpam n'ihe niile gbasara ego ole a na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

Nke a pụtara na gọọmentị ga-ahapụrụ ndị nkịtị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala, nke a kpọrọ 'independent marketers' na Bekee, ka ha were aka ha na-ahazi ego ole ha ga na-ere ngwaahịa ha.

Aha onyonyo,

Iwepụ 'fuel subsidy'Ọ ga-ebute ihe ịda oke ọnụ - Chizea

Ọ pụtakwara na gọọmentị agaghịzi na-etinye ego iji butuo ọnụahịa mmanụ 'petrol', bụ nke a kpọrọ 'subsidy'.

Ihe nke a na-egosi bụ na ọ bụrụ na ọnụahịa mmanụ agbidi (crude oil) rịa elu n'ahịa mba ụwa, ọnụ ahịa 'petrol' ga-agbali na Naịjirịa. Mana ọ bụrụ na ọ gbatuo, ọnụ ahịa 'petrol' ga-agbatu.

Gịnị kpatara gọọmentị Naịjirịa agaghị ahazinwu ọnụahịa 'petrol'?

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwere nkwa na ọchịchị ya ga-ebutu ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa

Otu ihe kpatara nke a bụ maka na Naịjirịa anaghị emepụta petrol ga-ezuru ndị bi na ya.

Ụlọọrụ atọ na-emepụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enweghị nke na-arụ ọrụ etu o kwesịrị.

Ya kpatara ụlọọrụ gọọmentị bụ 'Nigerian Natioonal Petroleum Corporation' na ndị nkịtị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala, na-azụ 'petrol' na mba ofesi, ma jiri ụgbọmmiri bubata ya na Naịjirịa.

Nke a pụtakwara na ọ bụ ihe ahịa nyere na mba ofesi ga-ekwu ego ole ha ga-ere ya na Naịjirịa.

N'oge mbụ, gọọmentị na-eji aka ha tinye ego ole a ga na-ere mmanụ ụgbọala, ma were ego akpa ya kwuzuo ndị na-ere ya ụgwọ nke fọrọnụ. Mana ugbua, ha esepụla aka na ya.

Ọ bụ ya mere ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji gbalie elu.

'Deregulation' ọ bụ ihe ọjọọ?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ụlọọrụ atọ na-emepụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa enweghị nke na-arụ ọrụ etu o kwesịrị.

Ndị ọkacha mara ekwuola na gọọmentị ekwesịghị itinye aka n'ego ole a na-ere mmanụ ụgbọala.

Ha kwuru na nke ahụ ga-eme ka ndị mmadụ bịa tinye ego ha ma hazie ngalaba mmanụ agbidi ka ọ kawanye mma.

Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ihe ihere na a naghị enwe ike imepụta 'petrol' na Naịjirịa, n'agbanyeghị na ọ bụ ebe a ka e si ebupu mmanụ agbidi.

'Deregulation' nwere ike inye aka ka ụdị ihe a kwụsị.

Mana ugbua amalitere ya ọhụrụ, ọ ga-afụ ndị mmadụ ụfụ n'ahụ, n'ihi na ọtụtụ ndị dabeere na petrol iji kpata ihe ha na-eri.

Kịtaa ọnụego ya rịrị, ọ gaghị atọ ndị mmadụ ọchị chaa chaa.