Restaurants: Lee ebe ị ga-enweta nri a kwọrọ aka sie na mpaghara ọwụwa-anyanwụ

  • Chimamaka Ihenacho
  • Broadcast Journalist, Igbo
Ndị na-akụ ngwọrị

Ebe foto si, Instagram/D'angels

Gọọmentị Naịjiria ahapụla ka ndị mmadụ na-erizi nri na 'restaurant', mana ị ma ebe ị ga-enweta nri ndị na-aba n'ụmị?

Nye ọtụtụ ndị, ihe na-aka agara ha bụ nri ndị e ji flawa mee, mana nye ndị ọzọ, ihe na-agụ ha agụụ bụ ebe ha ga-anọrọ ala, tọpee mgbado ukwu ha ma rie nri Igbo a kwọrọ aka sie.

Nri ndị a bụ nri ndị anaghị esikarị n'ụlọ, bụ nri ndị a na-eri n'oge mmemme, maọbụ mgbe ihe ọpụrụiche mere.

Kedụ ụdịrị nri anyị na-ekwu maka ya?

  • Nkwọbi
  • Isi ewu
  • Anụ nchị (bush meat)
  • Ụgba a gwọrọ agwọ
  • Akịdị
  • Azụ ndụ (point and kill)
  • Abacha
  • Ofe akwụ
  • Ofe mba mmiri (fisherman soup)
  • Ofe banga

Ebe foto si, Instagram/Matsecooks

Ị na-eme njem aga Ọwụwa-Anyanwụ, i bi ebe ahụ, ka ị na-alaru ụlọ alaru?

Lee ebe ndị BBC Igbo jụgara ajụjụ na steeti dị iche iche rụtụrụ aka kacha mma maka inweta nri e hiri asaa n'anya were sie:

N'Abịa steeti:

Nwanne ị wụnye Abịa ma ụkwụ gị atụbeghi n'ọgbọ ndị a, mara na ọ bụghi nri a kwọrọ aka sie ka i na-atụnye ego na ya.

Ma ị na-agarubeghi El-Dorado, Enitonia Hotel, CS Park, Chez Nous, mara na ị ka na-amụ amụ n'ebe nri dị ezigbo ụtọ nọ.

Garukwaa Onorugo, Latinos, Where else, D place, Network, Ndị ose, Evergreen wdgz, ka ị mara nke ekwe na-akụ.

Ekwela ka a kọọrọ gị maka ha, jiri ụkwụ gaa chọpụta ebe ndị a ozugbo.

Aha onyonyo,

Uru dị n'akwụkwọ nri

N'Anambara steeti:

Ị tụọ 'down' n'Anambara steeti ma ị garubeghi ebe ndị a, mara na ị kwọchabeghi akpịrị.

Ebe ndị dị ka Madam 12, madam social, Choice, Ịbarị Ado, Nwaanyị Awka.

N'Ebonyi:

Ị hụ ndị Ebonyi, ị hụla nri. Ị na-ajụ m etu ọ bụ?

Ebonyi bụ ebe ị ga-eji ihe na-erughi puku atọ rigide nri afọ eju gị.

Ị chee na ọ bụ asị, garuo Vegas, Ị ga-ata azụ ndụ, nkwọbi, ofe dị iche iche, eju a gwọrọ agwọ wdgz, na-atufughi oke ego.

Ebe ndị ọzọ bụ Latoya Kitchen dị na Mile 50, wdgz

N'Enugwu:

Ị garuo O42 ma ị tabeghi abacha, ị malitekwalanu njem?

Ebe ndị ga-ata abacha a kwọrọ aka gwọọ ma nọrọkwa ala rie, ṅụọ ma nweta onwe gị gụnyere Newberry's park, Dolphin, Ntachi ọsa, Open Sheraton, Filling Station,

Ebe ndị ọzọ gụnyere Hajịya, Ndọndọ, Vila Toscana, ZanzibarGustavo by Cubana, Ecstacy, 8 hours, Bush Bar, Item 7, Mama Onyinye, wdgz.

Ebe ndị a ezoghi ezo, onye ma ụzọ ga-atụziri gị aka ma ị jụọ.

N'Imo steeti:

Ị ruo Imo steeti ma ị gabeghi Ịbarị Ọgwa rie nri, i bidokwalanu? Ọ bụ na ị nụbeghi njakịrị ahụ na-ekwu na Owerri bụ "Ngwọrị headquarters"?

Ka ọ bụzị Jevinik ebe ị ga-enweta ma ụkwa, abacha, ụgba na isi okporoko?

Ị ga-enwetakwa ofe ọkazị na-apụ ọkụ, nakwa ofe Owere ga-agbanye gị ọbara n'ahụ nakwa nri ndị mba mmiri gụnyere ofe 'fisherman', 'afang' nakwa 'native'.

Jirikwa otu ụkwụ ahụ garuo Ndaa Lety, D'Angels, Mbari Kitchen, Manure, Hungryman na ndị ọzọ, ị ga-akụgide ngwọri e jiwe gị eji.\

Jiri nwaayọ loo asụ makana ama m na ọ gụwala gị ugbua.

Kedụ ebe ndị ọzọ kwesịrị ịdị n'ime akụkọ a anyị akpọghị aha?

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị