A kwụsịla ndị nkuzi Imsu abụọ dinara ụmụakwụkwọ ha ọrụ

Imsu

Ebe foto si, Imsu

Ihe dị n'ukwu arapụtala ndị nkuzi Mahadum Imsu abụọ dịka e setere ha n'onyonyo ebe ha chọrọ idina ụmụakwụkwọ ha.

Ugbua, ndị isi mahadum Imsu akwụsịtụla ndị nkuzi abụọ ahụ ọrụ ma malite nnyocha.

Onye ma maka ya bụ ihe gwara BBC Igbo na mmadụ abụọ ahụ e setere n'onyonyoo bụ nnukwu ndị nkuzi na Imsu.

Otu ji ọkwa 'Associate Professor' ebe onye nke ọzọ ji ọkwa ọkammụta maọbụ dọkịta.

Otu n'ime ha rụburu ọrụ dịka onyeisi ngalaba Chemistry, ebe onye nke ọzọ bubu onyeisi ngalaba Biochemistry.

Ihe onyonyo abụọ a agbasaala na soshal midia ebe ụmụ nwoke abụọ ahụ gbach ọtọ.

Aha onyonyo,

Ọka mmụta Boniface Igbenehue

Onye ahụ gwara BBC Igbo okwu kwuru na ihe dị otu a na-emekarị n'ụlọakwụkwọ mahadum mana ụjọ anaghị ekwe ụmụakwụkwọ kwuo ya.

Akụkọ kwuru na otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ enyela otu n'ime ndị nkuzi ahụ aka azụ ruru otu puku narị naịra na puku iri ise (N150,000).

Onye nkuzi ahụ naara ya ego ma sie ọnwụ na ọ ga-edinarịrị ya.

Nwa agbọghọ a kwetara, mana ọ gara gwa ndị ọrụ nchekwa, ha wee chebiri Agomuo n'ụlọ oriri na nkwari ebe ọ chọrọ ịnọ dinaa nwaagbọghọ ahụ.

Ọ bụ oge nwoke ahụ tọpụrụ ọgọdọ iji malite ọrụ ka ndị ọrụ nchekwa ahụ yicha akwa nkịtị pụtara nwụchie ya.

Aha onyonyo,

Nwata nwaanyị si mba Afrịka gaa India.

BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụakwụkwọ Imsu ajụjụ ọnụ, ha wee kwuo na ya bụ ihe mere n'ụbọchị Tuzde.

Ha gbakwara ama na o teela ya bụ onye nkuzi ji kpawa ụdị agwa ahụ mana o nweghị nwata akwụkwọ egwu kwere wegara ndịisi mahadum ahụ mkpesa.

Aha onyonyo,

SexforGrade: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya

Ụlọ ntaakụkọ Punch dere na ọnụ na-ekwuru Mahadum Imsu bụ Ralph Obinjoku kwuru na ha ehiwela kọmiti ga-eleba anya n'ebubo ahụ.

Obinjoku kwuru na "Mahadum Imsu agaghị eji okwu a gwuo egwu. Anyị anaghị anabata onye nkuzi idina mmadụ iji mee ka ọ gafee n'ule."

BBC Igbo na-agba mbọ ịnweta ozi si n'aka mahadum a.

Anyị kpọkwara ndị uweojii Imo steeti mana ha azabeghị ruo ugbua.

Ihe ọjọọ gbaa afọ

Ebe foto si, Getty Images

Ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ abụghị ihe ọhụrụ na mahadum dị icheiche na Naịjirịa.

BBC mere nnyocha pụrụ iche gbasara ụdịrị akụkọ a nke mere na Mahadum Legọs nakwa nke Ghana.

Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: