Gidado Siddiki: Ọ bụghị eziokwu na ndị Ugwu na-awụbata Anambara steeti

Gidado Siddiki: Ọ bụghị eziokwu na ndị Ugwu na-awụbata Anambara steeti

Onyeisi Miyetti Allah n'Ọwụwa Anyanwụ bụ Gidado Siddiki agọọla na si o nweghị eziokwu dị na kepukepu na ndị ọchiehi na-awụbata Ọka, Nise nakwa mpaghara dị iche iche n'Anambara steeti dịka a na-ebo n'ebubo na nsonso a.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Siddiki, onye tụrụ arịrị na ndị mpaghara ahụ na-akpọ ndị otu ha 'ndị ekperima' na 'ndị ntọ.' sị na ihe ndị otu ya ha na-achụ bụ nta ego.