Nasir El-Rufai: Ịpị amụ na ogbugbu bụ ihe chere onye dinara nwata n'ike na Kaduna

Nasir el-Rufa'i

Ebe foto si, Kaduna government

Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna Steetị etinyela aka n'iwu ga-eme ka a pịa nwoke ọbụla dinara nwaanyị n'ike nakwa wepu akpa nwa nwaanyị dinara nwata nwoke n'ike.

Iwu ọhụrụ a pụtara na ntaram ahụhụ dịịrị nwoke maọbụ nwaanyị dinara nwata n'ike ga-abụ ịpị nwoke nakwa iwepu akpa nwa nke nwaanyị.

A ga-ebipụta aha ndị dị etu a n'akwụkwọ mpụ na nrụrụaka nke mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke ọkaikpe steetị ga-etinyeaka na ya.

Site n'itinye aka n'iwu nke Gọvanọ El-Rufai mere n'ụbọchị 11 Sepụtemba, nke a pụtara na ọ bụrụ na iwu na Kaduna Steetị.

Iwu a sibu na ọ bụ nga afọ 21 ka onye dinara okenye n'ike ga-aga, ma sịkwa na onye dinara nwata n'ike ga-aga nga ruo oge ọ nwụrụ.

Ebe foto si, Getty Images

Mana, mmegharị iwu ahụ kpebiri na onye dinara onye gafere afọ 14 zute ịpị amụ maọbụ iwepu kpa nwa.

Mmegharị ọzọ bụkwa itinye na onye dinara nwata n'ike ga-enwete ikpe ọnwụ.

Gọvanọ El-Rufai kelere ndị Omeiwu Kaduna maka iwu ha binyere aka, ma kwuo na iwu tara akpụ ga-enye aka chekwa ụmụaka na steeti ahụ.

Ihe ndị nọ n'iwu ọhụrụ a gụnyere:

  • 1. Onye nwoke ọbụla dinara nwata nwaanyị maọbụ nwoke dị n'okpuru afọ 14 n'ike, a ga-apị amụ ma gbuo ya
  • 2. Onye nwaanyị ọbụla dinara nwata nwoke dị n'okpuru afọ 14 n'ike, a ga-ewepu akpa nwa ya ma gbuo ya
  • 3: Nwoke ọbụla dinara nwa nwoke dị n'okpuru afọ 14 ga-enwete ikpe ọnwụ
  • 4. A ga-etinye aha onye ọbụla ikpe mara maka ajọ agwa a n'akwụkwọ bu aha ndị na-akpa ụdịrị agwa a
  • 5: Ya bụrụ na onye edinara n'ike gafere afọ 14, a ga-apị amụ onye ikpe mara ma tụọ ya nga ebiebi
  • 6: Ya bụrụ n'onye ikpe mara bụ nwata, a ga-eji usoro dị n'iwu Bekee kpọrọ "Children and Young Person Law Cap 26 Laws of Kaduna State 1991" maa ya ikpe
  • 7: N'ikpe ikpe banyere idina nwata n'ike, ụlọikpe na ndị ọrụ ahụike ga-ejikọ aka ebe ọ masịrị.