Bishop T. D Jakes Igbo: Etu ị ga-esi mee ka omenala ndị be unu guzosie ike

Bishop T. D Jakes Igbo: Etu ị ga-esi mee ka omenala ndị be unu guzosie ike

Bishop Thomas Dexter Jakes Sr, onyeisi ụlọụka The Potter's House dị na mba Amerịka kọwara ihe mere o ji dị mkpa ka ndị mmadụ ghara ịchezọ ebe ha si.

O jikwa ohere a gwa ụmụ Afịrịka etu ha ga-esi jịkọta aka wee wụlite akụ na ụba mba ha.

Nke o kwuru kpakwara ọchị bụ etu ọsịsọ si atasịsị n'isi ya ma ọ na-eri nri Igbo. Gere ya n'uju.

Ndị azụmahịa Igbo zara oku Bishop T.D Jakes

Ụfọdụ ndị azụmahia Igbo dịka onyeisi Erisco foods (Eric Umeofia) nakwa 'Innoson motors' ekwuola na obi dị ha ụtọ imata na Bishop Thomas Dexter Jakes Sr bụ onye Igbo.

Ha kwukwara na ha ga-aza oku ọ kpọrọ maka mmekọrịta azụmahia ma na-ekwu na ha ga-achotakwuru ya ndị aka ha kwụ ọto n'azụmahia.

Erisco kwuru na ya ga-achọkwa ịmata ụdịrị azụmahia Bishop Jakes ga-achọ ime ka o wee mara.

'A na m achọ ndị Afrịka kwụwara aka ha ọtọ mụ na ha ga-azụkọ ahịa'- Bishop T.D Jakes

Bishop Thomas Dexter Jakes Sr, onyeisi ụlọụka The Potter's House dị na mba Amerịka, chọpụtara na ndị nna nna ya gbara mgbọrọgwụ n'ala Igbo.

Na nkata ya na BBC Igbo kpara, ọ kọwara etu o si chọwa ebe o si ma chọpụta na ọ bụ nwaafọ Igbo.

Lee ihe ndị ọzọ o kwuru maka ya n'uju ebe a:

O kwuru na nchọpụta a na-enye ya obi aṅụrị n'ụdị pụrụ iche.

Jakes a ma ọfụma dịka T.D Jakes, kwuru na ọ na-amụta ọtụtụ ihe n'omenala ndị Igbo nakwa n'aka ụmụ ya.

Ọ kwụsịghị ebe ahụ, ọ gara n'ihu kwuo na ọ gaghị adị mma ikwe ka teknụzụ na mmepe obodo gbanwee omenala onye.

O kwukwara na ọ bụrụ na ndị isi ojii mba Amerịka na ndị Afrịka amụtaghị etu e si ebikọ nakwa arụkọ, na ojii ga-anwụrụ onwe ha, ma kwuo na ha bịakọọ ọnụ, na ha ga-ebute mgbanwe pụrụiche na mpaghara Afrịka.

N'otu aka ahụ, ị ma na T.D Jakes eritula osikapa jọlọf nakwa akpụ?

Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru, Nnamdi Agbanelo na Chimezie Ucheagbo

Akụkọ ndị ga-amasị gị: