Ifeoma Abugu: Nnyocha gosiri na a tọgburu nwanne m nwaanyị - Alex Abugu
Ifeoma Abugu: Nnyocha gosiri na a tọgburu nwanne m nwaanyị - Alex Abugu
Alex Abugu bụ nwanne nwada Ifeoma Abugu kọwara BBC Igbo ihe dọkịta nyochara ozu ya chọpụtara.
O kwuru na ọ bụ ngalaba na-enyocha ebubo eboro SARS nke dị n'Abuja kpọrọ dọkịta ahụ ka ọ bịa kọwaa nchọpụta ya.
"Ị ma ndị uweojii gbaghaburu nnyocha mbụ nke mere ka ụlọikpe a kpọọ dọkịta nyochara ya ahụ" ka o kwuru.
O kwukwara na achọpụtara na ọ bụ ntọgbụ ka atọgburu nwa ada ahụ nke mere ka o kubie ma nwụọ.
E nyere ụbọchị iri abụo na atọ nke ọnwa Maachị na-abịa iji nyocha kwa ikpe ahụ ọzọ.