Independence Day Nigeria: Ọ fọrọ obere ka Jonathan, Yar’Adua na Obasanjo mebicha Naijiria - Buhari

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Twitter/Mbuhari

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọnọdụ Naijiria nọ ugbua bụ gọọmenti chịrị bido n'afọ 1999 rue 2015 oge ọ banyere ọchịchị tinyere Naijiria na ya.

Buhari kwuru nke a ụbọchị Tọzde n'ozi ọ gbasara n'ikuku dịka Naịjiria na-eme ncheta afọ 60 e nwetara Nnwereonwe n'aka mba Briten.

"Ndị chịrị ọchịchị bido na 1999 rue 2015 bụ ndị mebichara Naijiria bụ ndị nweziri ọnụ ha jị akatọ mbọ anyị na-eme."

Jonathan chịrị Naijiria bido n'afọ 2010 rue 2015 oge ọ hanyere ọchịchị n'aka Buhari.

Musa Yar'Adua chịrị afọ 2007 rue 2010, ebe Olusegun Obasanjo chịrị bido 1999 rue 2007.

O kwuru na o nweghị gọọmenti gara aga merela ihe ọchịchị ya ji nwa obere ego nọ n'akpa mee.

N'okwu mbuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala nke o kwuru na a ga-ebido rewe otu nari naira na iri isii na otu (N161), Buhari kwuru n'ọnụ mmanụ ka dị elu n'ụfọdụ mba dị n'Afrịka dịka Gana, Niger na Chad.

Ihe ndị mmadụ kwuru

Ndị Naịjirịa asaala Onyeisiala Muhammadu Buhari n'okwu o kwuru ebe ọ sị na ego mmanụ agbịdị ekwesighị ịka dị ọnụ na mba Saudi Arebia karịa na Naịjirịa.

Ndị mmadụ kwuru sị na o kwesịrị ịkwụlite ndị mmadụ ụgwọ tupu ọ tụnyewe ego ole a na-ere mmanụ agbịdị na Naịjirịa na mba ndị ọzọ ahụ ọ kpọrọ aha.

Nicholas Ibekwe kwuru sị na Naịjiria na-akwụ naanị pasentị iri n'ime ụgwọ opekatampe ndị Saudi Arebia na-akwụ ndị mba ha.

Bulama Bukarti tụnyere ego ole Naịjirịa na-akwụ n'ụgwọ opekatamba na nke Saudi Arebia na-akwụ ma kwuo na ọ bụrụ na Buhari malite ịkwụ ndị Naịjirịa ihe a na-akwụ na mba ahụ, na ndị Naịjiria ga-amalite ịkwụ ego ole ndị Saudi Arebia na-akwụ maka mmanụ ụgbọala.

Sodiq Alabi jụrụ sị "ego ole bụ ụgwọ opekatampe na mba ndị a?"

Lee ihe gbara ọkpụrụkpụ Buhari kwuru

Ọ malitere sị na ọ dị mkpa itule uche banyere etu Naịjiria si rute ebe ọ nọ ugbua, nke ga-eme ka mba a nwee ike ijikọ aka ọnụ wee toruo ebe ndị bi na ya na-atụ anya itoru dịka mba siri ike na-enweghi ihe pụrụ ikweli ya, ma bụrụ ebe olileanya na otu ohere ruru ma onye ukwu ma onye nta ga-ejikọ mba a.

1. Ihe gbasara ọnụ ego a na-ere mmanụ agbịdị

Buhari sị na n'ihi etu ihe siri dị mere e ji metụ aka n'ihe gbasara ego ole a ga na-ere mmanụ agbịdị.

O ji mba ndị dị ka Gana, Niger na Chad maa atụ maka etu Naịjirịa si ere na etu ndị agbataobi Naịjirịa na-emepụtakwa mmanụ agbịdị si ere nke ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ego mmanụ agbịdị ekwesighị ịka dị ọnụ na mba Saudi Arebia karịa na Naịjirịa. 

Buhari kwukwara na Naịjirịa ji mkpebi itinye uche na nrụgharị, inye aka nakwa ikpezi pụta agha Naịjirịa na Biafra. Mkpebi a nyere aka nye anyị mepee obodo pụrụiche ma hazie ọrụ gọọmentị iji nyere gọọmentị aka.

O kwuru na mgbe Naịjirịa natachara nnwereonwe, na Naịjirịa malitere ito na-abawanye site n'atụmatụ na iwu ndị e wepụtara nke metụtara mpaghara dị iche iche n'akụnaụba obodo.

Mana ọ sị na agha Naịjirịa na Biafra bere ya bụ atụmatụ ọdụdụ.

2. Naịjirịa mere ọfụma ma banye ọchịchị ndị nkịtị tupu ndị agha abịa ghasaa ya.

Buhari sị na ndị agha chịri Naịjirịa ruo afọ 29 n'ime afọ 60.

Buhari kwuru na Naịjirịa malitere ịga ọfụma dika alụchara afgha Naịjirịa na Biafra tupui ndị agha abịa nara ọchịchị ọzọ.

3. Nsogbu Naịjirịa si n'ịkpa oke aghara aghara

Buhari sị na ọkankụ nsogbu Naịjirịa na-enwe sitere n'oke agbụrụ ezigbiezi ndị mmadụ na-arụrụ aka kwa mgbe.

Buhari sị na ọrụ gọọmentị, uweojii, ụlọikpe, ndị agha lara azụ ọfụma na Naịjirịa.

Ọ sịkwa na ndị mmadụ na-ahụ onwe ha dịka ndị si mpaghara dị iche iche tupu ha ahụ onwe ha ka ndị Naịjirịa bụ ihe mbụ a ga-etinye uche na ya tupu a gawa n'ihu imezi Naịjiria.

Ọ sị na ndị Naịjirịa na-agba mbọ ebe niile nke bụ ezigbote ụzọ a ga-esi hazie nsogbu a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: