Chacha Eke Bipolar disorder: Gịnị ka ọ pụtara, gịnị bụ njirimara ya, kedụ etu e si agwọ ya?

Ebe foto si, chachaekefaani/Instagram
Chacha Eke pụtara n'ihe onyonye kwuo na ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ a kpọrọ bipolar disorder.
Onye a ma ama n'ime ihe nkiri bụ Chacha Eke pụtara n'ihe onyonyo kwuo na ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ a kpọrọ bipolar disorder.
Ọ sị na ọ bụ ọrịa a mere o ji pụta n'ihe onyonyo n'izuụka gara aga (ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba, 2020) ma bo di ye ebubo iti ya ihe.
Mana nwanne ya nwoke apụtala sị na nke a bụ asị na Chacha anaghị arịa ọrịa bipolar disorder.
Nke a mere anyị ji atụle ihe ọrịa pụtara na njirimara ya.
Gịnị bụ 'bipolar disorder'?
Ebe foto si, Science Photo Library
Nyocha ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Scheme' (NHS) nyere nkọwa banyere 'bipolar disorder'.
'Bipolar disorder' bụ ọrịa na-emetụta ụbụrụ nke nwereike ịgbanwe ọnọdụ mmadụ, ọnọdụ a nwereike igbanwe site n'ogogo otu ruo nke ọzọ n'otu ntabi anya.
Onye na-arịa ọrịa ụbụrụ a nwereike inwe nnukwu obi aṅụrị n'otu mgbe nke nwereike igbanwe ma bụrụ ọnọdụ nwute.
Njirimara 'Bipolar disorder'
Ndị na-arịa ọrịa ụbụrụ a na-ahụta ihe ndị di etu a:
- Ịda mba - Inwe mwute, ịdị ala na ịdị ka ọ bụ i kwesighi ekwesi
- Inwe akparamagwa dị aṅaa - Imebiga ihe oke, ikike, obi ụtọ
Onye na-arịa 'bipolar disorder' nwereike inwe mgbanwe ọnọdụ n'ime ọtụtụ izuụka.
Ịda mba
Ebe foto si, Getty Images
'Bipolar disorder' nwereike iweta echiche igbu onwe
Mgbe onye ahụ na-enwe obi ịda mba, njirimara ya gụnyere:
- Ọ ga na-enwe mwute, ka olileanya ọ gwụla, obere ihe ga na-agbakasị ya ahụ.
- Ike ga na-agwụ ya.
- Uche ya agaghị ezu oke, ọ ga na-enwe oke nchefu.
- O nweghi ihe ga na-amasị ya ime.
- Agụụ agaghị na-agụ ya.
- Ọ ga na-eme ka onye na-ezughi oke.
- Ọ ga-ara ya ahụ ihi ụra.
- Ọ ga na-eteta ụra ọsịsọ.
- Echiche igbu onwe ya.
- Ọ ga na-enwe ikpe ọmụma n'obi.
- Inwe obi abụọ.
Akparamagwa dị aṅaa
- Inwe oke obi ụtọ, aṅụrị karịrị oke
- Ọ ga na-ewe iwe ọsịsọ na ikwupu okwu ọsịsọ
- Ikike dị elu
- Onwe ya ịdị ya oke mkpa
- Inwe nnukwu echiche ọhụrụ na atụmatụ dị mkpa
- Ịkpọpụ uche ya ngwa ngwa
- Inwe iwe na mgbakasị ahụ ngwa ngwa
- Ịmụ anya arọ nrọ, na iche echiche na-enweghi isi
- Enweghi mmasị ihi ụra
- Erighi nri
- Ị na-emefu ego n'ihe na-abaghị uru na nke aka ya na-erughi
- Ị na-eme mkpebi maọbụ na-ekwu ihe ndị nwereike itinye ya na nsogbu
Ebe foto si, Getty Images
Ọgwụ e ji agwọ bipolar disorder
Bipolar disorder bụ ọnọdụ nwereike ịrị elu n'ogogoe kachasị. Onye na-arịa ọrịa a nwereike ọ gaghị ama mgbe o nwere oke obi ụtọ maọbụ obi ịda mba.
Ọ bụrụ ha lọghachite n'onodu dị mma ọ ga-eju ha anya ụdị agwa ha kpara. O nwere ndị ọ na-eme karịa ibe ha. Ụfọdụ ndị ga na-ahụ, anụ isi maọbụ ụda ihe ndị na-adịghị ebe ahụ.
Gịnị na-ebute ọrịa 'bipolar disorder'?
O nweghi onye ma kpọmkwem ihe na-ebute ya kama ọtụtụ ihe nwereike ịkpali ya.
- Oke ndọga ahụ na nchegbu
- Oke nsogbu
- Mburu pụta ụwa na mmiri ndụ
- Ihe omume na-agbanwe ndụ
Onye nwereike ịrịa ọrịa a?
Ọrịa ụbụrụ a bụ 'Bipolar disorder' na-emekarị ndị otu onye n'ime mmadụ narị.
O nwereike ime onye nọ n'ogogo afọ ọbụla, na-agbanyeghi na ọ na-amalitekarị n'etiti afọ 15 na 19. Onye gaferela afọ 40 nwereike ọ gaghị ebutezi ya.
Ọrịa ụbụrụ a nwereike ime nwoke maọbụ nwaanyị. O nwereike ime onye ọbụla.
Ebe foto si, Getty Images
Lithium bụ ọgwụ mbụ e ji gwọ 'bipolar disorder' mana nchọpụta gosiri na a na-enya ya mmadụ otu n'ime iri abụọ
Ụzọ ndị e ji agwọ ya gụnyere:
Ọ bụ dọkịta ụbụrụ isi bụ 'psychiatrist' nwereike ikwu ma mmadụ o nwere ọrịa bipolar disorder, o nweghi ọgwụgwụ mana e nwereike iji ọgwụ achịkwa ya.
- Ọgwụ ndị na-agwọ ịda mba na akparamagwa dị aṅaa.
- Mata ihe na-ebute mgbanwe ọnọdụ a ma gbara ha ọsọ.
- E nwere ọgwụ ndị dọkịta nwereike ịsị ka e were kwụsị ọrịa a.
- Ọgwụgwọ nke uche - Ị ga aga hụ onye ọkachamara ga-enyere gị aka ịgbanahụ ịda mba ma dụọ gị ọdụ maka mmekọrịta gị na ndị mmadụ.
- Ndụmọdụ etu e si ebi ndụ - Imega ahụ kwa mgbe, mee ihe ndị ga-enye gị obi ụtọ, rie nri ọfụma ma hie ụra ọfụma.
Ọgwụ mgbochi bipolar disorder
- Lithium
- Ọgwụ Anticonvilsant
- Ọgwụ Antipsychotic
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: