Ihe ndị mmadụ chọrọ n'aka ndị uweojii ugbua ha malitekwara ọrụ ha ọzọ
Ihe ndị mmadụ chọrọ n'aka ndị uweojii ugbua ha malitekwara ọrụ ha ọzọ
Ndị uweojii amalitekwala ọrụ ha ọzọ dịka ọgbaaghara so ngagharịiwe 'End SARS' kwụsịrị.
Cheta na kamgbe e mechara ngagharịiwe a, ọtụtụ ndị uweojii alaghachibeghị n'ihu ọrụ ha.
Nke a bụ maka ọtụtụ ụlọorụ nakw ụgbọala ndị uweojii e mebiri n'ọgbaaghara ahụ.
Ụfọdụ ndị uweojii tufukwara ndụ ha na ya bụ ọgbaaghara.
Mana Gọvanọ Enugu steeti nakwa ndị gọvanọ steeti dị icheiche rịọrọ ndị uweojii ka ha laghachikwa n'ọrụ ha.
Ha kwere ha nkwa inye ha nkwado niile dị ha mkpa i ji rụọ ọrụ ha nke ọma.
Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ nwere ikwu dịka ndị uweojii malitekwara ọrụ ha ọzọ n'Enugwu steeti.