World AIDS Day: Ihe m mere oge m chọpụtara na m bu HIV - James Brown

World AIDS Day: Ihe m mere oge m chọpụtara na m bu HIV - James Brown

James Brown bụ onye ọtụtụ ma ama na Naịjirịa dịka nwoke na-eyi akwa nwaanyị, nke Bekee kpọrọ 'Cross Dresser'.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọtahie Brown n'ihi etu o si ebi ndụ ya ma na-emekwa dịka nwaanyị.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'afọ 2018, ọ kọrọ akụkọ etu o si chọpụta na ya nwere ọrịa HIV/AIDS.

Brown kwuru na ọ bụ site n'afọ nne ya ka o si bute nje a, mana nna ya mere ka ọ mara nke a oge ọ dị afọ iri na abụọ.

Mana na-agbanyeghị ọrịa ahụ, Brown kwuru na ọ na-ebi ndụ ya nke ọma na-enweghị nsogbu ọbụla.

O kwukwara na HIV/AIDS abụghị ngwụcha ndụ.

Ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba afọ ọbụla bụ ụbọchị e wepụtara maka ọrịa HIV/AIDS.

Ọ bụ ụbọchị e ji akụzi maka ya bụ ọrịa, etu mmadụ ga-esi zeere ibute ya, nakwa etu ndị bu ya nwere ike i si bie ndụ ha nke ọma.