Amarachukwu Lilian Eze: Ahụhụ m tara n'ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere m ji malite ikuziri ụmụaka egwuregwu

Amarachukwu Lilian Eze: Ahụhụ m tara n'ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere m ji malite ikuziri ụmụaka egwuregwu

Amarachukwu Lilian Eze bụ onye nwe 'Lilly Legends Sports Academy' sị na ọ bụ ahụhụ ọ tara mgbe ọ na-amalite ịgba bọọlụ dịka nwaanyị mere o ji hiwe ụlọakwụkwọ ebe a na-akuziri ụmụmaka egwuregwu.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Amarachukwu kọwara na nne na nna enyeghi ya nkwado ịgba bọọlụ, nke mere o ji raa ya ahụ na mmalite.

Kama o mechara hapụ ebe ha gawa mba Afrịka ndị ọzọ dịka Senegaalụ na Equitorial Guinea bụ ebe ọ nọ gbata bọọlụ nke ọma.

Ọ sị na o si ebe ahụ banye zie na mba Eshia tupu ọ laa ezumike nka ma lọghachizie Naịjirịa malite nkuzi egwuregwu.

Ụdị egwuregwu ndị ọ na-akụzi gụnyere bọọlụ ụkwụ, ịgba karatị a na-akpọ Taekwondo, igwu mmiri dgz.

Eze nyere ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha kwado ụmụ ha n'ihe banyere egwuregwu ma ọ bụrụ ha nwee mmasị na ya.

Kirie ihe o kwuru n'uju;