Operation Delta Hawk: Etu ha si gbagbuo nwunye m n'ọdọahịa ya dị na Delta Steetị

Operation Delta Hawk: Etu ha si gbagbuo nwunye m n'ọdọahịa ya dị na Delta Steetị

Otu nwoke a kpọrọ Anayo akọwaala etu ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ 'Operation Delta Hawk' si gbagbuo nwunye ya n'ọdọahịa ya dị na Delta Steetị.

Anayo gwara BBC Igbo na ọ n'ebe ọ na-arụ ọrụ mgbe a kpọrọ ya n'ekwentị n'ihe dịka elekere ise nke anyasị sị na a gbara nwunye egbe.

Ka ọ na-erute ebe ahụ ọhụ ka ozu nwunye ya tọgbọ n'ala ya bụrụ na ọ nwụọla.

Mgbe ọ jụrụ kedụ ihe mere, a gwara ya na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa gọọmentị Delta Steetị e ji 'Delta Hawk' mara gbatara nwunye ya egbe mgbe ha na-achọ ụfọdụ ụmụọkoroọbịa nọ n'ụgbọala ọsọ.

Ọ sị na mechara buru nwunye ya gawa n'ụlọ gọọmentị steetị ahụ tupu e tinye ya n'ụlọozu.

Onye nchịkọta ndị nchekwa 'operation Delta Hawk' bụ David Tonwe sị ihe bụ ihe mberede ọjọọ, na ha na Anayo ezutele bụ nwunye nwaanyị.

Mgbe a jụrụ ya ma a nwụchiela ndị ọrụ ha kpara arụ a, ọ sị na nyocha ka na-aga n'ihu ịchọpụta etu ihe a si mee.

Kirie ihe onyonyo a n'ụju: