Arochukwu Massacre: Ndị Arochukwu akọọla etu ndị agha Naijirịa siri gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo ha n'oge agha Biafra

Arochukwu Massacre: Ndị Arochukwu akọọla etu ndị agha Naijirịa siri gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo ha n'oge agha Biafra

Agha Biafra bụ otu ihe ka na-eme ndị Igbo e cheta e bewe rukwaa ma taa.

Agụmọnụ gosiri na ndị nwụrụ n'agha ahụ, ọ kachasị ndị Igbo, karịrị mmadụ nde abụọ.

Asaba Massacre bụ otu ihe wuru ewu maka agha Biafra, dịka ndị agha Naịjirịa kpochapụrụ ọtụtụ mmadụ na'Asaba.

Mana ndị Arọchukwu akọọla etu ndị agha Naijirịa siri gbukwaa ọtụtụ ndị mmadụ na be ha bụ Arọchukwu, na-agbanyeghị na agha ebiela.

Ha kpọrọ nke a 'Arochukwu Massacre', ma kọwaa na ọtụtụ ndị torobịa ka e kpochapụrụ n'oge ahụ.

Lee ihe onyonoyo ebe ha kwuru etu mkpamkpa a sịrị mee n'Arọ.

Ndị mere akụkọ a bụ Chris Okereke, Vining Ogu na Adline Okere.