Anglican Priest Julius Dike:' Ọnọdụ m hụrụ ha, gosiri na o nwereike ịbụ nsị gburu ụkọchukwu, nwunye ya na nwanne m nwaanyị'

Joy Onuoha, Julius Dike na nwunye ya

Ebe foto si, Joy Onuoha /Min ChrisTim Facebookpage

Eze Nwachukwu ekwuola ihe o ji anya hụ dịka o nwetere ozi maka ọnwụ nwanne ya nwaanyị Joy, ụkọchukwu Julius Dike na nwunye ya, Agnes Dike.

O kwuru na ọ hụrụ nwanne ya nwaanyị ka ọ tọgbọrọ n'ala, hụ ozu nwunye ụkọchukwu ebe ọ tọgbọ n'ụlọ mposi nakwa hụ ozu ụkọchukwu Julius n'elu akwa ndịna ya.

Nwachukwu kwuru na ọnọdụ a ọ hụrụ ha gosiri na o nwereike ọ bụrụ nsi ka ha riri.

O kwuru na anya ikpeazụ ọ hụrụ nwanne ya nwaanyị bụ mgbe o were ego na-enya ya ka o nyere ya mama ha.

Nwachukwu kwuru na ụkọchukwu Julius Dike ji ụmụ anọ, otu n'ime ha so ya na ndị ọzọ bụgara ozu nne na nna ya n'ụlọ ozu ka ahụchara ozu ha.

O kwuru na ha na ụkọchukwu Julius bụ ezigbo ọyị mere nwanne ya nwaanyị ji ga-anọyere ya dịka ọ si eme na mbụ.

O kwuru na ha na-eche nyocha dọkita nke bekee kpọrọ 'autọpsy' ka ha mara ihe gburu ndị a.

Cheta na ndị uweojii nọ n'Abia steeti na-ekwu na ha ka na-eme nyocha ịji mara etu ọdachị a si mee.

Etu ụkọchukwu Anglican Julius Dike, nwunye ya nakwa onye enyemaka ha si nwụ ka ha kachara ụka

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Ụlọ ụka abụghi nke awakporo

Ndị mmadụ ka na-akwa arịrị maka etu Archdeacon Julius Dike bụ onyeisi nchụaja na St. Paul's Anglican Church, Abayi, Ariaria dị n'okpuruọchịchị Abia North, nwunye ya na onye ọzọ si nwụ ka ha kachara ụka abali fotere ụbọchị ọnwụ ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ebugala ozu mmadụ atọ a n'ụlọ ozu mana ha ka na-enyocha ka ha mara ebe mmiri si ba n'opi ugbọgịrị.

O kwuru na ọ bụ site na kepu kepu ka ha si mata na udiri ihe a mere makana ndị mmadụ gwara ha na mgbe ha lere anya ụkọchukwu n'ụtụtụ ibia kara ha ụka , ha ahụghị ya, nke mere ka ha gawa bee ya, kugide aka ma gbawa ụzọ huzie ozu ha atọ ebe ọ tọgbọọ.

Ogbonna kwuru na ebe ọ bụ na mmadụ atọ bi n'ụlọ nwụchara otu mgbe , ọ ga-arahụ i si na ọ bụ ihe a mere ha, ya bụ na ha ka na-eme nyocha ihe niile ha nwerike inyocha iji chọpụta etu ọdachị a si mee.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo,

Chioma Inyang: Ihe mere m ji were ankara kwaara onwe m uwe agbamakwụkwọ