World Language Day: Oge eruola mgbe anyị ga-eji asụsụ Igbo na-egosi Ịhụnanya -Uche Osoka
World Language Day: Oge eruola mgbe anyị ga-eji asụsụ Igbo na-egosi Ịhụnanya -Uche Osoka
Ọtụtụ mgbe ka nwoke na nwaanyị hụrụ onwe ha n'anya na-akpọ onwe ha aha bekee dị icheiche dịka 'baby', 'honey' dịrị gawazie.
Mana Uche Osoka chọrọ ka ya bụ ihe gbanwee, ka ndị Igbo were asụsụ Igbo na-egosi onwe ha ịhụnanya.
Iji mee ka nke a nwee isi, Uche Osoka wepụtara ihe ọ kpọrọ 'Igbo Romantic Dictionary' ebe o depụtara aha ụtọ dị icheiche nwoke na nwaanyị nwere ike ị na-akpọrịta onwe ha.
Aha ndị a gụnyere, 'anyanwụ ụtụtụ, asa mpete, ụdara nwannu, akwa ugo na ndị ọzọ.
Uche Osoka kọwaara BBC Igbo ihe kpalitere mmụọ ya idepụta aha ndị a.
Ndị mere akụkọ a bụ Chimezie Uche-Agbo na Nnamdi Agbanelo.