Ikemba Iweala: Ihe ị maghị maka odogwu nwoke a bụ di Ngozi Okonjo-Iweala

Ikemba Iweala

Ngozi Okonjo-Iweala etinyela aha Naịjirịa nakwa Afrịka n'akwụkwọ akụkọ n'ụwa niile, mana ọbụghị mmadụ niile ma maka di ya bụ Ikemba Iweala.

Igbo na-ekwu na ihe kwụrụ ihe ọzọ akwụdebe ya, otu a ka ọ dị na dụ Ikemba Iweala na nwunye ya bụ Ngozi Okonjo-Iweala.

Ebe foto si, Other

Nkọwa foto,

Oge ịhụnanya Ikemba Iweala na Ngozi Okonjo ka na-amalite amalite

Lee ihe asaa gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ Ikemba nke ụwa niile kwesịrị iji kwanyere ya ugwu.

  • Ikemba Iweala bụ onye Ụmụahia, isi obodo Abia Steeti. Ọ bụ nnukwu dibia bekee ma bụrụkwa ọkachamara na ngalaba ahụike gbasara ịwa ụbụrụ nke bekee na-akpọ 'neurosurgery'.
  • Ọ natara ọzụzụ ịbụ dọkịta na Mahadum University of Ibadan, ma fee ala Naịjirịa otu afọ n'otu ụlọọgwụ dị n'ime obodo Igbaja dị na Kwara steeti.
  • Oge o fechara ala nna ya, nke a kpọrọ 'National Youth Service Corps' na bekee, Ikemba Iweala gara mba England ebe ọ nọrọ nwetakwuo ọzọụzụ n'ụlọọgwụ 'Manchester Royal Infirmary' nakwa ụlọọgwụ ndị ọzọ na mba ahụ.
  • Ikemba Iweala si n'ụzọ dị otu a sonye n'otu 'Royal College of Surgeons of Edinburgh' nakwa 'Royal Society of Medicine'.
  • O mechara gafee mba Amerịka ebe ọ rụrụ ọrụ na mahadum 'University of Maryland Medical Systems' nke dị n'obodo Baltimore, nakwa 'George Washington University Hospital' nke dị na steeti Washington DC.
  • Dọkịta Ikemba Iweala malitere ụlọọrụ ọ kpọrọ 'Ike Foundation for Autism'. Ọrụ ha bụ inyere ndị nwere ọnọdụ Autism aka ka ha bie ndụ ha nke ọma
  • Di na nwunye a bụ Ikemba na Ngozi mụrụ ụmụ anọ: otu nwaanyị na ụmụnwoke anọ. Aha ha bụ Onyinye, Uzodimma, Okechukwu na Uchechi Iweala. Atọ n'ime ha (Onyinye, Uzodimma na Uchechi) bụcha dibia bekee, ebe onye nke ọzọ bụ ọkammụta nakwa ode akwụkwọ.