Imo State: Ndị niile Rochas Okorocha nyere ala na Ekwema Crescent gba aka

Okorocha na Uzodinma

Ebe foto si, Instagram

Gọọmentị Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-anapụta aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha ala nakwa akụnụba niile o ji aka ike weghara oge ọ nọ n'ọchịchị.

Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na nke a ihe ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ndị isi gọọmentị nwere n'Imo steeti n'ụbọchị Tọzde.

Gọvanọ Uzodinma kwuru na ụlọikpe enyela ha ikike ijichi ihe gọọmentị niile Okorocha weghaara n'ụzọ ezighị ezi.

Lee ọkpụrụkpụ ihe Uzodinma kwuru na ha kwekọrịtara n'ọgbakọ ahụ:

  • Anyị enyela Mịnịstịrị na-ahụ maka ala ikike iweghachite ihe gọvamentị niile e zuru n'ohi
  • Ndị nwere ala nakwa ụlọ na Ekwema Crescent bụ nke Rochas Okorocha napụrụ ha nye ndị ọzọ, ha ga-ewegharakwa ala ha
  • Onye ọbụla Rochas nyere ala na Ekwema Crescent gba aka.
  • Ọ bụrụ na onye ahụ arụọla ụlọ n'ala ahụ, onye nwe ala ga-ewere ụlọ ahụ
  • Ala 'old IBC Quarters' ebe Rochas okorocha rụrụ ụlọakwụkwọ ya bụ ala gọọmentị; gọọmentị ga-eweghara ya
  • Gọọmentị ga-eweghara mpaghara 'New Owerri'. Gọọmentị ga-akwatu ihe niile a rụrụ ebe ahụ
  • Gọọmentị ga-eweghara mpaghara 'Imo State Government Layout' nke Rochas Okorocha kesara nye ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya
  • Rochas Okorocha nwere ohere ruo Eprel 21 ịbịa zara ọnụ ya n'ụlọ ikpe, maọbụ gọọmentị ewekọrọ ihe niile ndị a kpamkpam

Ụlọikpe enyeala iwu ka e jichie ụfọdụ akụnụba Rochas Okorocha

Ebe foto si, Bayo Omoboriowo

Ụlọikpe ukwu dị n'Owerri enyela iwu ka e jichie nwa mgbe nta ụfọdụ akụnụba bụ nke gọọmentị Imo steeti na-ebo ebubo na aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha nwetara n'ụzọ n'ezighi ezi n'iwu.

Ọkaikpe Fred Njemanze nyere iwu a n'ụbọchị Tọzde dịka o kpebiri ikpe gbasara akwụkwọ gọọmentị Imo steeti gbara Rochas Okorocha site n'aka ọkaiwu Louis Alozie.

Mkpebi a ọkaikpe Njemanze nyere bụ ụdị nke bekee kpọrọ 'ex-parte order', nke pụtara na onweghị ọkaiwu Rochas Okorocha nọ ebe ahụ ikwuchitere ya ọnụ ya oge e kpebiri ya bụ ikpe.

Mana ọkaikpe Njemanze nyere ohere ụbọchị olemole ka onye nwe akụnụba ndị ahụ bịa kọwaa onwe ya, emeghị otu a, gọọmentị Imo ga-eweghara ha kpam kpam.

Dịka ụlọntaakụkọ Channels na The Cable si dee, akụnụba ndị ahụ gụnyere ala nakwa ụlọ dị na mpaghara dị icheiche n'Imo steeti, nke gọọmentị kwuru na Okorocha ji aka ike nakwa ụzọ nrụrụaka weghara ha oge ọ bụ gọvanọ.

Ebe foto si, Hope Uzodimma Instagram Page

Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na o nweghị aka na nsogbu dakwasara Rochas Okorocha mgbe ya na ndị otu ya gara n'ụlọ gọọmenti machiri.

O kwuru nke a mgbe ọ gara ikele onyeisiala Muhammdu Buhari maka nkwado o nyere ya na mbọ ọ na-agba iji weta udo n'obodo ọrlu dị na steeti ya ebe enwere ọgbaghara nso nso a.

Uzodimma kwuru na ọ bụ n'ọchịchị Ihedioha ka e hibere ọgbakọ ndị ọrụ ụlọikpe na steeti ya bidoro inyocha ebubo gbasara ala a nara ndị mmadụ n'ike ma nke e kwuru na ndị mmadụ were ala gọọmenti mere nke ha.

O kwuru na ka ndị ọrụ ụlọikpe ahụ nwechara nzụkọ, ha kwetere ka amachie ụfọdụ ụlọ arụrụ n'ala ndị a a na-ekwu maka ya, nke ma gọọmenti Imo steeti kwenyere na ya.

O kwuru na ọ bụ ndị ngalaba ọ bụ ọrụ ha imachi ụlọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ha.

"Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ahụ mma ya ga ụlọikpe makana ihe gbasara ọchịchị abụghị ihe e ji egwu egwu."

Iwu obodo agaghị agbanwe maka onye ọbụla - Gọọmentị Imo steeti

Gọọmentị Imo steeti esila n'ọnụ Enyinnaya Onuegbu na-elekọta ala na steeti ahụ zaghachi ebubo nke onye bụbu Govanọ bụ Rochas Okorocha boro ha.

Onuegbu kwuru na iwu obodo bụ iwu obodo nke agaghị agbanwe maka onye ọbụla nakwa na ihe dị ya mkpa bụ ọdịmma ndị Imo niile.

Ọ gbara ama nke na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere iji nụ olu ya maka nwuchi anwụchiri Okorocha.

"O rụọla otu izuụka kemgbe anyị gbachiri ụlọoriri ahụ tupu Okorocha na ndị otu ya abịa gbaka ụzọ ebe ahụ" ka o kwuru.

Lee ihe o kwuru n'uju ebe a

Hope Uzodimma echezọọla etu o si bata APC - Rochas Okorocha

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook/@realrochas/Twitter

Rochas Okorocha bụbu aka na-achị Imo steeti ekwuola na onye nọ n'ọkwa ahụ ugbua bụ Hope Uzodmimma echezọọla ka o si bata otu APC

O kwuru nke a dịka ya na BBC Igbo na-enwe mkparịtaụka n'ekwentị gbasara nwụchi anwụchiri ya n'Imo steeti ụnyaahụ.

Ọ kọwara sị na ọ bụ ndị ụweojii nke Gọvanọ onwe ya ji aka ya hazi na ndị akpụ obi bụ ndị lụsoro ndị nke ya ọgụ ma gbaa ha egbe ma kụwaa ha isi.

Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru na mkparịtaụka ahụ.

"Ihe a abụghị ihe m tụrụ anya ga-eme m"

Ebe foto si, @realRochas

Ndị uweojii kwụ ebe ahụ gbachị nkịtị dịka ihe a niile na-eme ma mechaa kpọzịa ndị uweojii ọzọ ha bịa nwụchie m.

Ihe kachasị tụ m n'anya bụ na ndị uweojii kwụ ebe ahụ ka ihe ndị a na-eme.

Ọ bụghị eziokwu na o ji ego gọọmentị rụ ụlọoriri ahụ, Ha eburu la okwu a gaa EFCC na ebe ndị ọzọ

Mgbe Uzodimma hụrụ na o nweghi isi, ọ tụgharịa sị na ebe arụrụ ụlọ abụghị ebe kwesiri.

A bụ m Rochas tupu m bụrụ gọvanọ n'Imo steeti" ka o kwuru gbasasra ebubo na o ji ego gọọmenti rụọ ebe dị icheiche na steeti ahụ.

"Ihe ndị a niile bụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'enweghi isi na ọdụ" ka o kwuru.

Ihe a bụ aghụghọ Uzodimma na-eme mgbe niile. Ọ mehie n'ụzọ ọbụla, o jiri ụlọikpe kpuchie onwe ya.

Ọ bụrụ na e nwereike ị me mụnwa bụ Rochas ụdịrị ihe a. Kekwanụ maka ndị ọzọ?" ka o kwuru na ngwụcha.

Mmadụ asụkapụla n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ndi otu ya ikpe

Ndị mmadụ na-eche n'Owerri Magistrate court dịka ndị uweojii na-akwado ịkpọpụta Rochas Okorocha n'ihu ọha.

BBC Igbo ga na-ewetere ụnụ etu ihe si aga ebe ahụ.

Mmadụ iri na ise ka ụlọikpe ahụ kpọpụtara ima ikpe.

Aha ha gụnyere, Chief Uche Nwosu, Lasbrey OkaforAnyanwu, Uzoma Anwuka, Ijeoma Igboanusi na ndị ọzọ.

Ihe mere eji nwụchie ma kpọpụta ndị a bụ maka etu ha si wụbata n'ụlọ 'Royal Spring Palm Hotel' gọọmenti machịrị nke iwu megidere.

Ndị niile ahụ kwụrụ na o nweghị ihe ọjọ ha mere.

Onye ntakụkọ anyị kwụrụ ahụghị Rochas Okorocha n'ụlọikpe ahụ nke eji akpọpụta aha ha na ndị a ga-ama ikpe.

Anyị atọhapụla Rochas Okorocha anwụchịrị ụnyahụ n'Imo steeti- Uweojii Imo steeti

Ebe foto si, BBC/Ikeokwu

Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha tọhapụrụ aka chiburu Imo state bụ Rochas Okorocha ndị uweojii nwụchịrị na steeti ahụ ụnyahụ.

Ikeokwu gwara ndị ntaakụkọ channels nke a mgbe a na-agba ya ajụjụ n'onyonyo ha n'ụtụtụ taa bụ Februwarị 22, 2021.

O kwuru na ya ndị otu ya ka na-eme nyocha ịmata ka okwu ahụ si malite na ihe merenụ.

Ikeokwu kwuru na onye ọbụla ikpe mara ga-aga ụlọikpe zara ọnụ ya.

Ihe anya m hụrụ na Royal Palm Hotel ụnyahụ riri m ọnụ n'Imo state- Rochas Okorocha

Aha onyonyo,

Rochas Okorocha: Etu ndị uweojii Imo ateeti si memina mụ na ndị otu m

Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha akọwaala etu ndị uweojii nọ n'Imo steeti si memina ya ndị otu ya ụnyahụ.

O kwuru na ọ gara ilebanya n'etu e si amachị ụlọ oriri na nkwarị ya akpọrọ Royal Palm Hotels n'Imo steeti mana ndị akpụobi ọ hụrụ ebe ahụ bidoro mewa ya na ndị otu ya iwa.

O kwuru na ndị uweojii kwụ na-elele ka ndị akpụ obi ahụ nọ na-eti ndị nke ya ihe ma mechaa gbawa egbe ma were ose anya gbaa ndị otu ya so ya bia ebe ahụ.

Okorocha kwuru na ndị uweojii mechara nwuchie ya mana ọ jụrụ ndị nyere ha ikike ime ihe ndị ha na-eme ya na ndị otu mgbe ha rutere na 'Royal Palm Hotel', ha kwuru na ha bụ ndị uweojii na nọ n'ụlọ obibi gọọmenti Imo steeti.

Rochas kwuru na a gbara ọgọ ya nwoke egbe nke ọ na-amaghị ma ọ ka ga-adịkwa ndụ makana ọ gbara oke ọbara.

O kwuru na mgbe a kpọ ya gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii, ọ jụrụ ha ihe bụ iwu ọ dara, ndị uweojii gwara ya na ọ bụ iwu 'conspiracy' na 'Public disorder' ka ọ dara.

O kwukwara na ndị uweojii gwara ya na ọbụ gọvanọ Hope Uzodimma nyere iwu ka ha nwụchie ya.

Rochas Okorocha ka na-ewukwa ruo ụtụtụ a dịka ụmụ Naịjirịa ebidola kwuwe maka etu e si nwụchị ya ụnyahụ bụ Februwarị 21,2021.

Ihe mere e jiri nwuchie Rochas Okorocha:

Nkọwa foto,

Rochas Okorocha n'ogige ndị uweojii

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha.

Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na Rochas Okorocha ji aka ya gaa ịgbape ogige 'royal palm estate' bụ nke ọchịchị Hope Uzodinma gbachiri.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya ugboro ugboro.

Mana onyonyo apụtala ebe Rochas Okorocha nọdụrụ ala n'ogige ndị uweojii mana o dobeghị anya oge e sere ya bụ onyonyo.

Nkọwa foto,

Onyonyo na-egosi ebe Rochas Okorocha nọ n'ime ụgbọala ndị uweojii

Onye enyemaka mgbasaozi Rochas Okorocha bụ Ebere Nzewuji gwakwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndị uweojii ji nna ya ukwu.

Nzewuji kwukwara na ndị ekperima si n'aka gọọmentị Imo steeti wakporo Okorocha oge ọ gara n'ụlọ oriri na nkwari nke nwunye ya nwe.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ekperima ahụ gbara onye uweojii na-echekwa Okorocha egbe, ma merụkwaa ụfọdụ ndị ọzọ so ya ahụ.

Ihe gọọmentị Imo steeti kwuru

Ebe foto si, Hope Uzodinma

Nkọwa foto,

Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti

N'aka nke ọzọ, onye enyemaka mgbasa ozi Gọvanọ Hope Uzodinma bụ Oguike Nwachukwu kwuru na ihe niile Nzewuji kwuru abụghị eziokwu.

Nwachukwu kwuwu na gọọmentị kpọchiri ogige ahụ akpọchi n'ihi na ọ bụ ihe a natara n'aka onye zuru ya ezu.

Mana Rochas Okorocha kpọọrọ ndị agboro ga kụpụ igodo e ji kpọchie ebe ahụ ma banye ya n'ike.

Nwachukwu gara n'ihu kwuo na ọ bụ ọrụ ndị uweojii ịhụ na ndị mmadụ rubere isi n'iwu gọọmentị.

O kwukwara na ebubo Okorocha na-ebo na ọ bụ gọọmentị Imo steeti zigara ndị omekome wakporo ya na ndị otu ya bụ okwu asị.

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto,

Ogige Royal Palm Estate nke nwunye Rochas Okorocha nwe, mana gọọmentị Imo steeti ewegharala ya.

Cheta na gọọmentị Imo steeti kwuru na ogige 'royal palm estate' bụ ụlọ Rochas Okorocha ji ego nakwa ala Imo steeti rụọ n'ụzọ ezighi ezi.

Lee onyonyo ebe kọmịshọna okwu ala dị n'aka n'Imo steeti, bụ Enyinnaya Onuegbu gbachiri ogige 'royal palm estate' nke nwunye Rochas Okorocha nwe.

Nke a mere ka ha weghara ya dịka kọmiti nyochara ya bụ ihe si nye ikike.

Nkọwa foto,

A kurichara ụgbọala ndị so Rochas Okorocha

Rochas Okorocha na-arụ ọrụ ugbua dịka onye nnọchi anya mpaghara Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ 'senate'.

Ọ bụkwa onyeisi ụlọọrụ a kpọrọ 'Rochas Foundation' nke o malitere tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Nkọwa foto,

Ụgbọala ọzọ so Rochas akụriri

Gọọmentị Imo steeti, malite n'ọchịchị Emeka Ihedioha, ebola Rochas Okorocha ebubo dị icheiche gbasara nrụrụaka nakwa iri ego gọọmentị.

Cheta oge kọmiti e hibere maka ịnapụta ihe gọọmentị ezuru n'ohi wakporo otu ụlọ ebe ha kwuru naUloma Nwosu, nwa Rochas Okorocha, na-ezo ihe gọọmentị dị icheiche o zuru n'ohi.

Aha onyonyo,

Rochas Okorocha: Ihe mere anyị ji kpachitụ akụnaụba ya

EFCC depụtakwara ọtụtụ ụlọ na akụnụba dị icheiche nke ha boro ebubo na ọ bụ Rochas nwe ya.

Ha kwuru na ihe ndị ahụ bụ ego si n'akpa gọọmentị Imo steeti ka Okorocha ji nweta ha.

Mana Rochas Okorocha gwara BBC n'oge ahụ na ihe ndị ahụ niile bụ ebubo ụgha.