George Obiozor Video: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị - Ohaneze ndị Igbo
George Obiozor Video: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị - Ohaneze ndị Igbo
"Nnamdi Kanu bụ nwa anyị nwoke, ọ bụ otu n'ime anyị, ọ ga-egerịrị ntị ma mee ihe anyị gwara ya."
Nke a bụ okwu Ọkammụta George Obiozor kwuru n'ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ Ohaneze Ndigbo nke ngalaba Legọs.
George Obiozor kwukwara na ndị Igbo achọghị ịpụ na Naịjirịa n'ihi na onweghị okwu ọbụla na-esere ha na Naịjirịa.
Ọ gara n'ihu kwuo na okwu gbasara Biafra abụghị okwu ndị ntorobịa ga-etinye ọnụ n'ihi na ọ karịrị ha.
Gere ya n'uju n'ihe onyonyo a.
Akụkọ ga-amasị gị: